isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 22 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Chineke nwara Abraham, si ya, Abraham; ọ si, Lekwam.

2. Ọ si, Biko, were nwa-gi nwoke nke i nwere nání ya, onye i huru n'anya, bú Aisak, je ala Moraia; sure ya n'ebe ahu, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, n'elu otù nime ugwu ahu nke M'gāsi gi je.

3. Abraham we bilie n'isi-ututu, jikwa inyinya-ibu-ya, chiri madu abua nime umu-okorọbia-ya tiyere onwe-ya, na Aisak, bú nwa-ya nwoke; ọ kpọwa nkú nke àjà-nsure-ọku, bilie, je ebe ahu nke Chineke siri ya-ri je.

4. N'ubọchi nke-atọ Abraham weliri anya-ya abua, hu ebe ahu n'ebe di anya.

5. Abraham we si umu-okorọbia-ya, Nọdunu ebe a n'onwe-unu, unu na inyinya-ibu, ma mu onwem na nwa-okoro a gēje ebe ahu; ayi gākpọ kwa isi ala, chigharikute unu.

6. Abraham we were nkú àjà-nsure-ọku, bo Aisak nwa-ya nwoke; o jide n'aka-ya ọku na mma; ha abua we yikọ je.

7. Aisak we gwa Abraham, bú nna-ya, okwu, si, Nnam; ọ si, Lekwam, nwam. Ọ si, Le, ọku na nkú: ma òle ebe nwa-aturu iji chu aja-nsure-ọku di?

8. Abraham we si, Chineke gāhuru Onwe-ya nwa-aturu iji chu aja-nsure-ọku, nwam: ha abua we yikọ je.

9. Ha biarue ebe ahu nke Chineke siri ya-ri je; Abraham we wue ebe-ichu-aja n'ebe ahu, do nkú ahu n'usoro, ke Aisak, bú nwa-ya nwoke, ab͕ú, tukwasi ya n'elu ebe-ichu-àjà, n'elu nku.

10. Abraham we setia aka-ya, were mma ahu ib͕u nwa-ya nwoke.

11. Ma mọ-ozi nke Jehova siri n'elu-igwe kpọ ya òkù, si, Abraham, Abraham: ọ si, Lekwam.

12. Ọ si, Esetila aka-gi tukwasi n'aru nwa-okoro ahu, eme-kwa-la ya ihe ọ bula: n'ihi na ub͕u a ka M'mara na onye nātu egwu Chineke ka i bu, n'ihi na i b͕ochighi nwa-gi nwoke, nke i nwere nání ya, iwere ya nyem.

13. Abraham we welie anya-ya abua hu, ma, le, otù ebulu n'azu ya, nke alughi-ulù nējide ya na mpi-ya: Abraham we je, were ebulu ahu, sure ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku n'ọnọdu nwa-ya nwoke.

14. Abraham we kpọ aha ebe ahu Jehova-Jaire: dika anāsi rue taa, N'ugwu nke Jehova ka agāhu ya.

15. Mọ-ozi nke Jehova we si n'elu-igwe kpọ Abraham òkù nke ub͕ò abua,

16. si, Ejim Onwem ṅu iyi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, na n'ihi na i mewo ihe a, n'ihi na i b͕ochighi kwa nwa-gi nwoke, onye i nwere nání ya:

17. na n'igọzi M'gāgọzi gi, n'ime ka aba uba M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, na dika ájá nke di n'usọ oké osimiri; nkpuru-gi gēnweta kwa ọnu-uzọ-ama nke ndiroya;

18. ọ bu kwa na nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi onwe-ha; n'ihi na i gewo nti n'olum.

19. Abraham we chigharikute umu-okorọbia-ya, ha bilie, yikọ je Bia-sheba; Abraham we biri na Bia-sheba.

20. O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na egosiri Abraham, si, Le, Milka, ya onwe-ya amuwo-kwa-ra nwa-nne-gi nwoke, bú Nehoa, umu-ndikom;

21. Uz, bú ọkpara-ya, na Buz, bú nwa-nne-ya, na Kemuel, bú nna Eram

22. na Kesed, na Hazo, na Pildash, na Jidlaf, na Betuel.

23. Betuel we mua Rebeka: madu asatọ ndia ka Milka muru nye Nehoa, bú nwa-nne Abraham.

24. Iko-ya nwayi, onye aha-ya bu Reuma, ya onwe-ya mu-kwa-ra Tiba, na Gaham, na Tahash, na Meaka.