isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 1 Bible Nso (IGBOB)

1. Na mbu Chineke kere elu-igwe na uwa.

2. Uwa we buru ihe tọb͕ọrọ n'efu na ihe tọb͕ọrọ nkití; ọchichiri di kwa n'elu ob͕u-miri: Mọ Chineke nērughari kwa n'elu miri.

3. Chineke we si, Ka ihè di: ìhè we di.

4. Chineke we hu ìhè ahu, na ọ di nma: Chineke we kpa ókè n'etiti ìhè ahu na ọchichiri ahu.

5. Chineke we kpọ ìhè ahu Ehihie, ọchichiri ahu ka Ọ kpọkwara Abali. Anyasi we di, ututu we di, buru otù ubọchi.

6. Chineke we si, Ka mbara di n'ab͕ata miri ahu, ka ọ nọ kwa nākpa ókè n'etiti miri na miri.

7. Chineke we me mbara ahu, kpa ókè n'etiti miri ahu nke di n'okpuru mbara ahu na miri ahu nke di n'elu mbara ahu: ọ we di otú a.

8. Chineke we kpọ mbara ahu Elu-igwe. Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-abua.

9. Chineke we si, Miri ahu nke di n'okpuru elu-igwe, ka achikọta ha n'otù ebe, ka ahú kwa ala-akọrọ: ọ we di otú a.

10. Chineke we kpọ ala-akọrọ ahu Ala; nchikọta miri ahu ka Ọ kpọkwara Oké Osimiri: Chineke we hu na ọ di nma.

11. Chineke we si, Ka ala puputa ahihia ndu, ihe-ọkukú nke nāmiputa nkpuru-ọghigha, osisi mkpuru nke nāmi mkpuru di iche iche, nke mkpuru-ọghi-gha-ya di nime ya, n'elu ala: o we di otú a.

12. Ala we weputa ahihia ndu, ihe-ọkukú nke nāmiputa nkpuru-ọghigha di iche iche, ya na osisi nke nāmi mkpuru di iche iche, nke nkpuru-ọghigha-ya di nime ya: Chineke we hu na ọ di nma.

13. Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-atọ.

14. Chineke we si, Ka ihe nke nēnye ihè di na mbara elu-igwe ikpa ókè n'etiti ehihie na abali; ka ha buru kwa ihe igosi ihe-iriba-ama di iche iche, na igu mb͕e akara àkà, na igu ubọchi na arọ:

15. ka ha buru kwa ihe nēnye ìhè nime mbara elu-igwe inye ìhè n'elu uwa: o we di otú a.

16. Chineke we kpua ihe uku abua ahu nke nēnye ìhè; Ọ kpuru ihe ahu nēnye ìhè nke ka uku ka ọ nāchi ehihie, na ihe ahu nēnye ìhè nke ka ntà ka ọ nāchi abali: Ọ kpukwara kpakpando nile,

17. Chineke we tinye ha nime mbara elu-igwe inye ìhè n'elu uwa,

18. na ichi ehihie na ichi abali, na ikpa ókè n'etiti ìhè na ọchichiri: Chineke we hu na ọ di nma.

19. Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-anọ.

20. Chineke we si, Ka miri nuputa ihe nēnuputa enuputa, bú anu nwere nkpuru-obi di ndu, ka anu-ufe feghari kwa n'elu uwa n'iru mbara elu-igwe.

21. Chineke we kè ogologo anu uku nile di na miri, na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke nākpu akpu, nke miri nuputara, di iche iche, na anu-ufe nile ọ bula di iche iche nke nwere nku: Chineke we hu na ọ di nma.

22. Chineke we gọzie ha, si, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa miri di n'oké osimiri nile, ka anu-ufe ba kwa uba n'uwa.

23. Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-ise.

24. Chineke we si, Ka ala weputa anu di iche iche nwere nkpuru-obi di ndu, anu-ulo, na ihe nākpu akpu, na anu-ọhia di iche iche nke uwa: o we di otú a.

25. Chineke we me anu-ọhia di iche iche nke uwa, na anu-ulo di iche iche, na ihe nile ọ bula di iche iche nke nākpu akpu n'ala: Chineke we hu na ọ di nma.

26. Chineke we si, Ka ayi kpua madu n'onyinyo-ayi, dika oyiyi-ayi si di: ka ha nwe kwa ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu-ulo, na n'aru uwa nile, na n'aru ihe nile ọ bula nākpu akpu nke nākpu akpu n'elu uwa.

27. Chineke we kè madu n'onyinyo-Ya, n'onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwayi ka O kere ha.

28. Chineke we gọzie ha: Chineke we si ha, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa uwa, buda ya n'okpuru onwe-unu; nwekwanu ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu nile ọ bula di ndu nke nākpu akpu n'elu uwa.

29. Chineke we si, Le, enyewom unu ihe-ọkukú nile ọ bula nāmiputa nkpuru-ọghigha, nke di n'elu uwa nile, na osisi nile ọ bula, nke nkpuru osisi nāmiputa nkpuru-ọghigha di nime ya; unu ka ọ diri ibu ihe-oriri:

30. o bu kwa anu-ọhia nile ọ bula nke uwa ka M'nyeworo akwukwọ ihe-ọkukú nile ọ bula, nye kwa anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe, nye kwa ihe nile ọ bula nke nākpu akpu n'elu uwa, nke nkpuru-obi di ndu di nime ya, ibu ihe-oriri: ọ we di otú a.

31. Chineke we hu ihe nile ọ bula O mere, ma, le, ọ di nma nke-uku. Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-isi.