isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 29 Bible Nso (IGBOB)

1. Jekob we zọlie ukwu-ya, jerue ala umu Iru-anyanwu.

2. Ọ hu, ma, le, olùlù-miri n'ọhia, ma, le, n'ebe ahu ìgwè ewu na aturu atọ nāmakpu n'akuku ya; n'ihi na ọ bu n'olùlù-miri ahu ka ha nēme ka ìgwè aturu-ha ṅua: nkume di kwa uku nke di n'elu ọnu olùlù-miri ahu.

3. Anāchikọta kwa ìgwè aturu nile n'ebe ahu: ha akpọrepu nkume ahu n'elu ọnu olùlù-miri ahu, me ka ìgwè ewu na aturu ṅua, ha eweghachi nkume n'elu ọnu olùlù-miri n'ọnọdu-ya.

4. Jekob we si ha, Umu-nnem, òle ebe unu si bia? Ha si, Heran ka ayi si bia.

5. Ọ si ha, Unu mara Leban nwa Nehoa? Ha si, Ayi mara ya.

6. Ọ si ha, Ọ̀ nọ n'udo? Ha si, Ọ nọ n'udo: ma, le, Rechel, bú nwa-ya nwayi, nābia, ya na ìgwè ewu na aturu-ya.

7. Ọ si, Le, ubọchi fọduru ri nne, nka abughi mb͕e anāchikọta anu-ulo: menu ka ìgwè ewu na aturu-unu ṅua miri, jenu zùa ha.

8. Ha si, Ayi apughi, rue mb͕e agāchikọta ìgwè aturu nile, ha we kpọrepu nkume n'elu ọnu olùlù miri a: ayi we me ka ìgwè ewu na aturu nua.

9. Mb͕e ọ nọ nākpayere ha uka, Rechel biara ya na ìgwè ewu na aturu nke nna-ya nwere; n'ihi na onye-ọzùzù-aturu ka ọ bu.

10. O rue, mb͕e Jekob huru Rechel, bú nwa-nwayi Leban nwa-nne-ya, na ìgwè ewu na aturu Leban, bú nwanne nne-ya, na Jekob jeruru nso, kpọrepu nkume ahu n'elu ọnu olùlù-miri ahu, me ka ìgwè ewu na aturu Leban, bú nwanne nne-ya, ṅua.

11. Jekob we sutu Rechel ọnu, welie olu-ya, kwa ákwá.

12. Jekob we gosi Rechel na nwa-nne nna-ya ka ọ bu, na nwa Rebeka ka ọ bu kwa: ọ we b͕a ọsọ, gosi nna-ya.

13. O rue, mb͕e Leban nuru akukọ Jekob, bú nwa nwa-nne-ya, na ọ b͕ara ọsọ izute ya, ọ b͕akua ya, sutu ya ọnu nke-uku, me ka ọ ba n'ulo-ya. Ọ we kọrọ Leban ihe nile ndia.

14. Leban we si ya, N'ezie ọkpukpum na anu-arum ka i bu. Ya na ya we nọ ogologo otù ọnwa.

15. Leban we si Jekob, Ọ̀ bu n'ihi na nwa-nnem ka i bu na i gēfèm n'efu? gosim, gini gābu ugwọ-ọlu-gi?

16. Ma Leban nwere umu-ndinyom abua: aha nke-okenye bu Lia, aha nke-ntà bu Rechel.

17. Anya Lia esighi ike; ma Rechel mara nma n'aru ma kwa nma ile anya.

18. Jekob we hu Rechel n'anya; ọ si, M'gēfè gi arọ asa n'ihi Rechel, bú nwa-gi nwayi nke-ntà.

19. Leban we si, Ọ di nma ka m'nye gi ya, kari were ya nye nwoke ọzọ: nọyerem.

20. Jekob we fè òfùfè n'ihi Rechel arọ asa; ha di n'anya-ya dika ubọchi ole-na-ole, n'ihi ihu-n'anya o ji hu ya.

21. Jekob we si Leban, Nyem nwunyem, n'ihi na ubọchim nile ezuwo, ka m'we bakuru ya.

22. Leban we chikọta ndi ebe ahu nile, me oké oriri.

23. O rue, n'anyasi, na o kuru Lia nwa-ya, me ka ọ bakuru Jekob; Jekob we bakuru ya.

24. Leban we nye ya Zilpa, bú nwayi nējere ya ozi, ka ọ buru nwayi nējere Lia nwa-ya nwayi ozi.

25. O rue na, n'ututu Jekob wee hu na nwanyi ahu bu Lia: ọ we si Leban, Gini bu nka i meworom? Ọ̀ bughi n'ihi Rechel ka m'efère òfùfè n'aka gi? n'ihi gini kwa ka i ghọb͕urum?

26. Leban we si, Adighi-eme otú a n'ebe nke ayi, inye nke-ntà tutu enye nke-okenye.

27. Debezue abali asa nke nwayi a, ma ayi gēnye kwa gi nwayi a n'ihi òfùfè i gēfè kwa ọzọ n'akam arọ asa ọzọ.

28. Jekob we me otú a, debezu abali asa nke Lia: ọ we nye ya Rechel nwa-ya na nwunye.

29. Leban we were Bilha, bú nwayi nējere ya ozi, nye Rechel nwa-ya nwayi, ka ọ buru nwayi nējere ya ozi.

30. Ọ we bakuru kwa Rechel, ọ we hu kwa Rechel n'anya kari Lia, we nēfè òfùfè n'aka Leban arọ asa ọzọ.

31. Jehova we hu na onye anākpọ asì ka Lia bu, Ọ we meghe àkpà-nwa-ya: ma Rechel bu nwayi-àgà.

32. Lia we turu ime, mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Reuben: n'ihi na ọ siri, N'ihi na Jehova elekwasiwo nweda-n'alam anya; n'ihi na ub͕u a dim gāhum n'anya.

33. Ọ turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke; ọ we si, N'ihi na Jehova anuwo na onye anākpọ asì ka m'bu, n'ihi ya ka Ọ nye-kwa-ram nka: ọ we kpọ aha-ya Simeon.

34. Ọ turu ime ọzọ, mua-nwoke; ọ we si, Ub͕u a na mb͕e a ka dim gārapara n'arum, n'ihi na amuworom ya umu-ndikom atọ: n'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Livai.

35. Ọ turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke: ọ we si, Na mb͕e a ka m'gēkele Jehova: n'ihi nka ka ọ kpọrọ aha-ya Juda; ọ we kwusi imu nwa.