Ọ hu, ma, le, olùlù-miri n'ọhia, ma, le, n'ebe ahu ìgwè ewu na aturu atọ nāmakpu n'akuku ya; n'ihi na ọ bu n'olùlù-miri ahu ka ha nēme ka ìgwè aturu-ha ṅua: nkume di kwa uku nke di n'elu ọnu olùlù-miri ahu.