isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 21 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndia bu ikpé nke i gētiye n'iru ha.

2. Mb͕e i b͕ata orù, bú onye-Hibru, arọ isi ka ọ gābu orù-gi: ma n'arọ nke-asa ọ gāpu nwere onwe-ya n'efu.

3. Ọ buru na ọ bata nání ya, ọ gāpu nání ya: ọ buru na onye nwere nwunye ka ọ bu, nwunye-ya gēso kwa ya pua.

4. Ọ buru na onye-nwe-ya enye ya nwunye, nwayi ahu ewe muara ya umu-ndikom ma-ọbu umu-ndinyom; nwayi ahu na umu-ya gābu ihe onye-nwe-ya nwere, ma ọ gapu nání ya.

5. Ma ọ buru na orù ahu asi n'ezie, Ahurum onye-nwem na nwunyem na umum n'anya; m'gaghi-apu nwere onwem:

6. onye-nwe-ya gēme kwa ka ọ biakute Chineke nso, ọ gēme kwa ka ọ biarue nso ọnu-uzọ, ma-ọbu nso awara-uzọ; onye-nwe-ya gēwere arà rapue nti-ya; ọ gābu kwa orù-ya rue mb͕e ebighi-ebi.

7. Ma mb͕e nwoke gēre nwa-ya nwayi ka ọ buru orù-nwayi, ọ gaghi-apu dika ọpupu orù-ndikom.

8. Ọ buru na ọ jọ njọ n'anya onye-nwe-ya, bú onye kwere na ya onwe-ya gālu ya na nwunye, ọ gēkwe kwa ka ab͕aputa ya: ọ gaghi-enwe ike ire ya nye ndi ala ọzọ, n'ihi na ọ ghọb͕uru ya.

9. Ma ọ buru na ọ kwere na nwa-ya nwoke gālu ya, dika ihe ekpere n'ikpe bayere umu-ndinyom si di, otú a ka ọ gēme ya.

10. Ọ buru na ọ lutara ya nwunye ọzọ; ọ gaghi-ewebì anu-oriri-ya, na ihe-nb͕okwasi-ya, na ihe kwesiri ya dika nwunye.

11. Ma ọ buru na ọ meghi ihe atọ ndia nye ya, ọ gāpu kwa n'efu, nēnyeghi ego.

12. Onye nētib͕u madu, ọ we nwua, aghaghi ime ka ọ nwua.

13. Ma onye nēcheghi anwu, ma Chineke mere ka ọ dabà n'aka-ya; M'gēdoro gi ebe ọ gāb͕alaga.

14. Ma mb͕e onye ọ bula gēwere nganga biakwasi ibe-ya, ib͕u ya n'aghughọ; n'ebe-ichu-àjàm ka i gēwepu ya ka ọ nwua.

15. Onye nēti nna-ya, ma-ọbu nne-ya, ihe, aghaghi ime ka ọ nwua.

16. Onye nēzu madu n'ori re ya, ma-ọbu na asi na ahu ya n'aka-ya, aghaghi ime ka ọ nwua.

17. Onye nākọcha nna-ya, ma-ọbu nne-ya, aghaghi ime ka ọ nwua.

18. Mb͕e ndikom nēse okwu, ma otù nime ha ewere nkume ma-ọbu iwere ọkpọ ti ibe-ya, ma ọ nwughi, ma o dina n'ihe-ndina ọria:

19. ma ọ buru na o bilie, jeghari n'èzí, dabere na nkpa-n'aka-ya, agāgu onye tiri ya n'onye ikpé nāmagh: ọ bu nání na ọ gēnye ya ihe bayere nb͕uru-ya, me kwa ka aru-ya di ike nke-ọma.

20. Mb͕e onye ọ bula gēwere nkpa-n'aka ti orù-ya nwoke, ma-ọbu orù-ya nwayi, ọ we nwua n'okpuru aka-ya; aghaghi ibọ ọ́bọ̀-ya n'aru ya.

21. Ma otú ọ di, ọ buru na otù ubọchi ma-ọbu ubọchi abua ka ọ gānọru, agaghi-abọ ọ́bọ̀-ya n'aru ya: n'ihi na ego-ya ka ọ bu.

22. Mb͕e ndikom nālu ọgu, we tie nwayi di ime ihe, ime-ya we pua, ma ajọ ihe aputagh: aghaghi iri ya nra, dika di nwayi ahu gātukwasi ya; ọ gēnye kwa site n'aka ndi-ikpé.

23. Ma ọ buru na ajọ ihe aputa, i gēme kwa ka ndu lara ndu,

24. anya lara anya, ezé lara ezé, aka lara aka, ukwu lara ukwu,

25. ida-ọku lara ida-ọku, ob͕ub͕u-mma lara ob͕ub͕u-mma, ufiri-utari lara ufiri-utari.

26. Mb͕e onye ọ bula gēti anya orù-ya nwoke, ma-ọbu anya orù-ya nwayi, ihe, we bibie ya; o gēzipu kwa ya ka ọ nwere onwe-ya n'ihi anya-ya.

27. Ọ buru kwa na ọ me ka ezé orù-ya nwoke ma-ọbu ezé orù-ya nwayi dapu; ọ gēzipu kwa ya ka o nwere onwe-ya n'ihi ezé-ya.

28. Mb͕e ehi gāsọ nwoke ma-ọbu nwayi mpì, o we nwua, aghaghi itub͕u ehi ahu na nkume, agaghi-eri kwa anu-ya; ma agāgu onye-nwe ehi ahu n'onye ikpe nāmaghi.

29. Ma ọ buru na ehi ahu bu ehi nāsọ mpì na mb͕e gara aga, ewe b͕ara onye-nwe-ya àmà, ma o debeghi ya nke-ọma, kama o mere ka nwoke ma-ọbu nwayi nwua; agātub͕u ehi ahu na nkume, ọzọ kwa, agēme ka onye-nwe-ya nwua.

30. Ọ buru na ihe ikpuchi nmehie-ya ka agātukwasi ya, ọ gēnye ihe-nb͕aputa nke ndu-ya, dika ihe nile agātukwasi ya si di.

31. Ma ọ bu nwa-nwoke ka ọ sọrọ mpì, ma ọ bu nwa-nwayi ka ọ sọrọ mpì, dika ikpé a si di ka agēme ya.

32. Ọ buru na orù-nwoke ma-ọbu orù-nwayi ka ehi ahu sọrọ mpì; orú shekel ọla-ọcha na iri ka ọ gēnye onye-nwe-ya, agātub͕u kwa ehi ahu.

33. Mb͕e onye ọ bula gēmeghe olùlù, ma-ọbu mb͕e onye ọ bula gēgwu olùlù, ghara imechi ya, ehi ma-ọbu inyinya-ibu ewe dabà nime ya,

34. onye-nwe olùlù ahu gākwughachi ihe; ego ka ọ gēnyeghachi onye-nwe-ya, nke nwuru anwu gābu kwa nke aka ya.

35. Mb͕e ehi onye ọ bula gēmeru ehi nke madu-ibe-ya aru, ọ we nwua; ha gēre kwa ehi di ndu, kè ego-ya: ọzọ kwa, nke nwuru anwu ka ha gēkè.

36. Ma-ọbu asi na amara na ehi ahu bu ehi nāsọ mpì na mb͕e gara aga, ma onye-nwe-ya edebeghi ya nke-ọma; ọ ghaghi ikwughachi ehi n'ọnọdu ehi ahu, nke nwuru anwu gābu kwa nke aka ya.