isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 34 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we si Moses, Wara onwe-gi mbadamba nkume abua dika nke-mbu: M'gēdekwasi kwa na mbadamba nkume ahu okwu nile nke di n'elu mbadamba nkume mbu, nke i tupiara.

2. Nọ na njikere rue ututu, rigota n'ugwu Sainai n'ututu, guzorom onwe-gi ọtọ n'ebe ahu n'elu ugwu ahu.

3. Ọ dighi kwa onye ọ bula gēsoro gi rigota, ọzọ kwa, ka aghara ihu onye ọ bula n'ugwu ahu nile; ọzọ, ìgwè ewu na aturu ma -ọbu ìgwè ehi atala nri n'akuku ugwu ahu.

4. Ọ we wa mbadamba nkume abua dika nke-mbu; Moses we bilie n'isi-ututu, rigorue ugwu Sainai, dika Jehova nyere ya iwu, o were kwa mbadamba nkume abua n'aka-ya.

5. Jehova we ridata n'igwe-oji, o guzo onwe-ya n'ebe Ọ nọ n'ebe ahu, we kpọkue aha Jehova.

6. Jehova we gabiga n'iru ya, kpọ òkù, si, Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi-ebere, Onye nēme amara, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Onye nāba uba n'ebere na ezi-okwu;

7. Onye nēdebere nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri ọtutu ub͕ò ebere, Onye nāb͕aghara ajọ omume na njehie na nmehie: ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmaghi; Ọ nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu umu, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ.

8. Moses we me ngwa, rube isi-ya n'ala, kpọ isi ala.

9. Ọ si, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi, Onye-nwe-ayi, biko, ka Onye-nwe-ayi nēje n'etiti ayi; n'ihi na ndi kwesiri olu ike ka ayi bu; Gi b͕aghara kwa ajọ omume-ayi na nmehie-ayi, keta kwa ayi n'ihe-nketa.

10. Ọ we si, Le, Mu onwem nāb͕a ndu: n'iru ndi-gi nile ka M'gālu oké ọlu di iche iche, bú nke ọ dighi mb͕e ekere ha n'uwa nile, ma-ọbu nime mba ọ bula: ndi nile ndi gi onwe-gi nọ n'etiti ha gāhu kwa ọlu Jehova, n'ihi na ihe-egwù ka ọ bu, bú nke Mu onwem nēme n'ebe i nọ.

11. Debere onwe-gi ihe nke Mu onwem nēnye gi n'iwu ta: le, M'gaje ichupu ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, n'iru gi.

12. Lezie onwe-gi anya, ka gi na ndi bi n'ala nke gi onwe-gi nābà nime ya ghara ib͕a ndu, ka ọ we ghara ibu ọnyà n'etiti gi:

13. kama unu gākwatu ebe-ichu-àjà nile ha, tupia ogidi nile ha, b͕utu Asherim-ha:

14. n'ihi na i gaghi-akpọ isi ala nye chi ọzọ: n'ihi na Jehova, Nke Onye-ekworo bu aha-Ya, Chineke ekworo ka Ọ bu:

15. ka gi na ndi bi n'ala ahu we ghara ib͕a ndu, ha we so chi-ha nākwa iko, churu chi-ha àjà, otù onye ewe kpọ gi, i we rie ufọdu nime ihe àjà-ya;

16. i we lutara umu-gi ndikom ufọdu nime umu-ha ndinyom, umu-ha ndinyom we so chi-ha nākwa iko, me kwa ka umu-gi ndikom soro chi-ha nākwa iko.

17. Gi emerela onwe-gi chi akpuru akpu.

18. Ememe achicha ekoghi-eko ka i gēdebe. Ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko, dika M'nyere gi iwu, na mb͕e akara àkà n'ọnwa Ebib: n'ihi na ọ bu nime ọnwa Ebib ka i siri n'Ijipt puta.

19. Nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa bu nkem; na anu-ulo-gi ọ bula nke bu oké, nwa nke meghere àkpà-nwa ehi ma-ọbu aturu.

20. Ma nwa inyinya-ibu nke meghere àkpà-nwa, i gēwere nwa-aturu b͕aputa ya: ma ọ buru na i b͕aputaghi ya, i gāb͕aji kwa olu-ya. Ọkpara ọ bula n'etiti umu-gi ka i gāb͕aputa. Ma ọ dighi onye agāhu n'irum ka ọ b͕a aka.

21. Ubọchi isi ka i gālu ọlu-gi, ma n'ubọchi nke-asa i gākwusi: n'ilu-ọlu-ubi na n'owuwe-ihe-ubi i gākwusi.

22. I gēme-kwa-ra onwe-gi ememe nke izù asa nke ubọchi asa, bú nke nkpuru mbu nke obìbì ọka wheat, na ememe nke nchikọta-ihe n'ọb͕ub͕a arọ.

23. Ub͕ò atọ n'arọ ka agāhu ndikom-i nile n'iru Onye-nwe-unu Jehova, bú Chineke nke Israel.

24. N'ihi na M'gānara mba di iche iche ala-ha n'iru gi, me ka ókè-ala-gi nile sa mbara: ọ dighi kwa onye ọ bula gēnwe anya-uku n'ebe ala-gi di, mb͕e i nārigo ka ewe hu gi n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ub͕ò atọ n'arọ.

25. Eb͕upula ọbara nke àjàm n'elu ihe nēko achicha; àjà ememe ngabiga agaghi-adigide kwa abali nile rue ututu.

26. Ihe mbu nke nkpuru mbu nke ala-ubi-gi ka i gēwebata n'ulo nke Jehova, bú Chineke-gi. Esila nwa-ewu nime miri-ara nke nne-ya.

27. Jehova we si Moses, Dere onwe-gi okwu ndia n'ihe: n'ihi na dika okwu ndia si di ka M'b͕aworo ndu n'etiti Mu na gi, na n'etiti Mu na umu Israel.

28. Ọ we nọ n'ebe ahu, ya na Jehova, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri o riri, ọ dighi kwa miri ọ ṅuru. Ọ we de n'elu mbadamba nkume abua ahu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú okwu iri ahu.

29. O rue, mb͕e Moses siri n'ugwu Sainai rida (mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu di kwa n'aka Moses mb͕e o siri n'ugwu ahu rida), na Moses amaghi na akpukpọ iru-ya nēnwuputa ìhè mb͕e Ọ kpayere ya uka.

30. Eron na umu Israel nile we hu Moses, ma, le, akpukpọ iru-ya nwuputara ìhè; ha we tua egwu ibiaru ya nso.

31. Moses we kpọ ha òkù; Eron na ndi-isi nile nime nzukọ ahu we laghachikute ya: Moses we gwa ha okwu.

32. Emesi kwa umu Israel nile biaruru nso, ọ we nye ha n'iwu uka nile nke Jehova kpayere ya n'ugwu Sainai.

33. Moses we gwabìe ha okwu, kpudo ihe-nkpudo n'iru-ya.

34. Ma mb͕e ọ bula Moses bara nime n'iru Jehova ikpayere Ya uka, ọ wezuga ihe-nkpudo ahu rue mb͕e ọ putara: ọ we puta, gwa umu Israel ihe nke enyere ya n'iwu;

35. umu Israel we hu iru Moses, na akpukpọ iru Moses nēnwuputa ìhè: Moses we kpughachi ihe-nkpudo ahu n'iru-ya, rue mb͕e ọ bara nime ikpayere Ya uka.