isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 22 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e onye ọ bula gēzu ehi ma-ọbu aturu, we b͕ue ya, ma-ọbu re ya; ehi ise ka ọ gākwughachi n'ọnọdu ehi ahu, ma-ọbu aturu anọ ka ọ gākwughachi n'ọnọdu aturu ahu.

2. Ọ buru na ahú onye-ori ka ọ nētipú ulo, ewe tib͕ue ya, o we nwua, ọ dighi ikpe-ọmuma ọbara gādi bayere ya.

3. Ọ buru na anyanwu awakwasi ya, ikpe-ọmuma ọbara gādi bayere ya: ọ ghaghi ikwu-ghachi; ọ buru na o nweghi ihe, agēre kwa ya n'ihi ori-ya.

4. Ọ buru na achọta ihe ahu n'aka-ya n'ezie, bú nke o zuru n'ori, ma ọ bu ehi, ma-ọbu inyinya-ibu, ma-ọbu aturu, na ndu; ọ gākwughachi okpukpu abua.

5. Mb͕e onye ọ bula gēme ka anumanu ta nri n'ubi ma-ọbu n'ubi-vine, o we zipu anumanu-ya, o we ta nri n'ubi onye ọzọ; ihe kachasi nma nke ubi-ya, na ihe kachasi nma nke ubi-vine-ya, ka ọ gākwughachi.

6. Mb͕e ọku gāb͕a, we b͕akuru ogwu, ọku ahu we richapu obo ọka, ma-ọbu ọka guzoro eguzo, ma-ọbu ọhia; onye mere ka ọku ahu b͕a aghaghi ikwughachi.

7. Mb͕e onye ọ bula gēnye ibe-ya ego ma-ọbu ihe idebe, ewe zue ya n'ulo nwoke ahu; ọ buru na achọta onye-ori ahu, ọ ghaghi ikwughachi okpukpu abua.

8. Ọ buru na achọtaghi onye-ori ahu, onye-nwe ulo ahu gābiakute Chineke nso, imara ma o setipughi aka-ya n'aru ihe madu-ibe-ya jetara n'ozi.

9. Okwu bayere ihe-njehie ọ bula, ma ọ bu okwu bayere ehi, bayere inyinya-ibu, bayere aturu, bayere uwe-nb͕okwasi, bayere ihe ọ bula furu efu, nke madu nāsi, Nka bu ya, Chineke ka okwu ha abua gābiakute; onye Chineke gāma ikpe, ọ gākwughachi ibe-ya okpukpu abua.

10. Mb͕e onye ọ bula gēnye ibe-ya inyinya-ibu, ma-ọbu ehi, ma-ọbu aturu, ma-ọbu anumanu ọ bula, idebe: o we nwua, ma-ọbu ihe meruru ya aru, ma-ọbu adọta ya n'agha, ma ọ dighi onye nāhu ya:

11. Iyi nke Jehova gādi n'etiti ha abua, imara ma o setipughi aka-ya n'aru ihe ibe-ya jetara n'ozi; onye-nwe anumanu ahu gānara ya, ọ gaghi-akwughachi kwa.

12. Ma o buru na ezuru ya n'ori n'aka-ya n'ezie, ọ gākwughachi onye-nwe-ya.

13. Ọ buru na anu ọhia dọb͕uru ya n'ezie, ya webata ya ka ọ buru ihe-àmà; ọ gaghi-akwughachi ihe anu-ọhia dọb͕uru.

14. Mb͕e onye ọ bula gāriọta anumanu n'aka ibe-ya, ihe we meru ya aru, ma-ọbu ọ nwua, mb͕e onye-nwe-ya nānọghi yere ya, ọ ghaghi ikwughachi.

15. Ọ buru na onye-nwe-ya nọyere ya, ọ gaghi-akwughachi: ọ buru na ọ bu ihe egoro ọlu, ọ biara n'ihi ugwọ-ọlu-ya.

16. Mb͕e nwoke gārafu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke nke ọ dighi nwoke kwere ilu ya, o we dinayere ya, ọ ghaghi inye ego ọlulu bayere ya ka ọ buru nwunye-ya.

17. Ọ buru na nna-ya ajusi ike iwere ya nye ya, ọ gākwu ego dika ego ọlulu umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke si di.

18. Ekwela ka nwayi-mb͕asi di ndu.

19. Onye ọ bula ya na anumanu nēdina, aghaghi ime ka ọ nwua.

20. Onye nāchuru chi àjà, ma-ọbughi ichuru Jehova, nání Ya, agēwezuga ya ka ebibie ya.

21. Gi emela ọbìa ihe-ike, emeb͕u-kwa-la ya: n'ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt.

22. Nwayi ọ bula di-ya nwuru, ma-ọbu nwa-nb͕ei, unu ewedala ya n'ala.

23. Ọ buru na i weda ya n'ala ma-ọli, ọ we tikuem n'uzọ ọ bula n'ezie, aghaghm inu ntiku-ya;

24. iwem gādi ọku, M'gēwere kwa mma-agha b͕ue unu; nwunye-unu gāghọ ndinyom di-ha nwuru, umu-unu gāghọ kwa umu-nb͕ei.

25. Ọ buru na i binye onye ọ bula n'etiti ndim ego, bú onye ewedara n'ala, onye gi na ya nọ, aburula ya dika onye nānara ọmuru-nwa; unu atukwasi-kwa-la ya uma.

26. Ọ buru na i were uwe-nb͕okwasi madu-ibe-gi n'ihe-ibe ma-ọli, mb͕e ọdida-anyanwu ruru ka i gēwere ya nyeghachi ya:

27. n'ihi na nke ahu bu ihe-nb͕okwasi o nwere nání ya, nke ahu bu uwe-nb͕okwasi-ya iyikwasi n'akpukpọ-aru-ya: ọ̀ bu nime gini ka o gēdina? o gēru kwa, mb͕e ọ nētikum, na M'gānu; n'ihi na onye-amara ka M'bu.

28. Gi akọchala Chineke, abu-kwa-la onye-isi ndi-gi ọnu.

29. Alala azú inye ùjú-gi na ihe-ọṅuṅu-gi. Nwa-nwoke eburu uzọ mu nime umu-gi ndikom ka i gēnyem.

30. Otú a ka i gēmere ehi-gi, na ìgwè ewu na aturu-gi: ubọchi asa ka ya na nne-ya gānọ: n'ubọchi nke-asatọ i gēwere ya nyem.

31. Ndi di nsọ ka unu gāburum: unu eri-kwa-la anu nke anu-ọhia dọb͕uru n'ọhia; nkita ka unu gātudara ya.