isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 2 Bible Nso (IGBOB)

1. Otù nwoke nke sitere n'ulo Livai we je luru nwa-nwayi Livai na nwunye.

2. Nwayi ahu we turu ime, mua nwa-nwoke: mb͕e ọ huru ya na nwa mara nma ka ọ bu, o zobe ya ọnwa atọ.

3. Ọ pughi kwa izobe ya ọzọ, ọ we meere ya ub͕ọ papyrus, were kwa bitumen na pitch te ya; o we tiye nwa ahu nime ya, tiye ya n'etiti ami n'usọ osimiri Nail.

4. Nwa-nne-ya nwayi we guzo onwe-ya n'ebe di anya, imara ihe gēme ya.

5. Nwa-nwayi Fero we ridata isa aru n'osimiri Nail; umu-ab͕ọghọ-ya we nējeghari n'akuku osimiri Nail ahu; o we hu ub͕ọ ahu n'etiti ami, zìe orù-ya nwayi iweta ya.

6. O we meghe ya, hu nwa ahu, ma, le, ọ bu nwata-nwoke nākwa ákwá. O we nwe ọmiko n'aru ya, si, Otù nime umu ndi-Hibru ka nka bu.

7. Nwa-nne-ya nwayi we si nwa-nwayi Fero, #M'gēje kpọrọ gi nwayi nēnye nwa ara site na ndinyom Hibru, ka ọ we nyere gi nwa nka ara?

8. Nwa-nwayi Fero we si ya, Je. Nwa-ab͕ọghọ ahu we je kpọ nne nwa ahu.

9. Nwa-nwayi Fero we si ya, Kuru nwa nka la, nyerem ya ara, mu onwem gēnye kwa gi ugwọ-ọlu-gi. Nwayi ahu we kuru nwa ahu, nye ya ara.

10. Nwa ahu we tó etó, nne-ya we me ka ọ biakute nwa-nwayi Fero, ọ we ghọrọ ya nwa nke ya. Ọ kpọ aha-ya Moses, si, N'ihi na nime miri ka m'dọputara ya.

11. O rue na mb͕e ahu, mb͕e Moses toputaworo, na ọ pukuru umu-nne-ya, ihu ihe ngbu ha anya: o we hu nwoke Ijipt ka o nētib͕u nwoke Hibru, otù nime umu-nne-ya.

12. Ọ we lee anya n'otù akuku, lee kwa anya n'akuku ọzọ, ma mb͕e ọ huru na ọ dighi onye ọ bula, o tib͕ue onye Ijipt ahu, zobe ya n'ájá.

13. Ọ we pua n'ubọchi nke-abua, ma, le, ndikom Hibru abua nālu ọ̀gù: ọ we si onye ahu nke ikpe mara, N'ìhi gini ka i nētib͕u nwanne gi?

14. Ọ si, Ònye mere gi ka i buru onye-isi na onye-ikpe n'ebe ayi nọ. Ọ̀ bu ib͕um ka gi onwe-gi nēkwu okwu-ya, dika i b͕uru onye Ijipt? Moses we tua egwu, si, N'ezie amawo okwu a.

15. Fero we nu okwu a, ọ we chọ ib͕u Moses. Moses we b͕apu n'iru Fero, nọdu n'ala Midian: o we nọdu ala n'akuku olùlù-miri.

16. Ma onye-nchu-àjà Midian nwere umu-ndinyom asa: ha we bia, se miri, b͕aju ebe anētiye miri ime ka ìgwè ewu na aturu nke nna-ha ṅua.

17. Ndi-ọzùzù-aturu we bia, chupu ha: ma Moses biliri, zọputa ha, me ka ìgwè ewu na aturu-ha ṅua miri.

18. Ha we biakute Reuel, bú nna-ha, ọ si, Gini mere unu ji bia ngwa ngwa ta?

19. Ha si, Nwoke Ijipt o setara ayi miri nke-ọma, me ka ìgwè ewu na aturu-ayi ṅua.

20. Ọ si umu-ya ndinyom, Òle ebe ọ nọ kwa? n'ìhi gini bu nka na unu arapuwo nwoke ahu? kpọnu ya, ka o we rie nri.

21. Moses we kwere ibiri n'ulo nwoke ahu: o we nye Moses Zipora nwa-ya nwanyi na nwunye.

22. Nwanyi ahu we mua nwa-nwoke, Moses we kpọ aha-ya Giashom: n'ihi na ọ siri, Ọbìa ka m'bu-woro n'ala ọzọ.

23. O rue, n'ọtutu ubọchi ahu, na eze Ijipt nwuru: umu Israel we nēze ume n'ihi òfùfè-ha, ha we tie nkpu, ntiku ha tikuru Chineke we rigorue Chineke nti, n'ihi òfùfè ahu.

24. Chineke we nu isu-ude-ha, Chineke we cheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya, nke Ya na Abraham na Aisak na Jekob b͕ara.

25. Chineke we hu umu Israel, Chineke we mara.