1. Israel we bulie ije, ya na ndi nile o nwere, ọ biarue Bia-sheba, chuara Chineke nke nna-ya Aisak aja.
2. Chineke we gwa Israel okwu n'ọhù nke abali, si, Jekob, Jekob. Ọ si Lekwam.
3. Ọ si, Mu onwem bu Chineke, bú Chineke nke nna-gi: atula egwu irida n'Ijipt; n'ihi na mba uku ka M'gēme gi ka i ghọ n'ebe ahu.
4. Mu onwem gēso gi rida n'Ijipt; ọ bu kwa Mu onwem gēme ka i rigota kwa n'ezie: Josef gātukwasi kwa aka-ya n'anya-gi abua.
5. Jekob we si na Bia-sheba bilie: umu Israel we buru Jekob, bú nna-ha, na umu-ntakiri-ha, na nwunye nile ha, n'ub͕ọ-ala nke Fero zitereri ibu ya.
6. Ha chiri anu-ulo-ha, na àkù-ha, bú nke ha kpatarari n'ala Kenean, bata n'Ijipt, bú Jekob na nkpuru-ya nile tiyere onwe-ya:
7. ya na umu-ya ndikom, na umu-ndikom nke umu-ya ndikom, umu-ya ndinyom, na umu-ndinyom nke umu-ya ndikom, ọ bu nkpuru-ya nile ka o mere ka ha so ya bata n'Ijipt.
8. Ma ndia bu aha umu Israel, ndi batara n'Ijipt, Jekob na umu-ya ndikom: ọkpara Jekob, bú Reuben.
9. Umu-ndikom Reuben; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami.
10. Umu-ndikom Simeon; Jemuel, na Jamin, na Ohad, na Jakin, na Zoba, na Shaul, bú nwa nke nwayi Kenean ahu.
11. Umu-ndikom Livai; Giashon, na Kohat, na Merari.
12. Umu-ndikom Juda; Ia, na Onan, na Shila, na Perez, na Zera: ma Ia na Onan nwuru n'ala Kenean. Umu-ndikom Perez bu kwa Hezron, na Hamul.
13. Umu-ndikom Isaka; Tola, na Puva, na Job, na Shimron.
14. Umu-ndikom Zebulun: Sered, na Ilon, na Jahleel.
15. Ndia bu umu-ndikom Lia, nke ọ muru nye Jekob nime Padan-eram, ha na Daina, bú nwa-ya nwayi nkpuru-obi nile nke umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom bu orú na iri na atọ
16. Umu-ndikom Gad; Zifyon, na Hagi, na Shuni, na Ezbon, na Iri, na Arodi, na Areli.
17. Umu-ndikom Asha; Imna, na Ishva, na Ishvi, na Beria, na Sera, bú nwa-nne-ha nwayi: umu-ndikom Beria kwa; Heba na Malkiel.
18. Ndia bu umu-ndikom Zilpa, onye Leban nyere Lia nwa-ya nwayi, ọ we muara Jekob ndia, bú nkpurui-obi iri na isi.
19. Umu-ndikom Rechel, bú nwunye Jekob; Josef na Benjamin.
20. Ewe muara Josef n'ala Ijipt Manase na Efraim, ndi Asenat, bú nwa-nwayi Poti-fera onye-nchu-àjà nke On, muru nye ya.
21. Umu-ndikom Benjamin; Bela na Beka, na Ashbil, na Gira, na Neaman, na Ihi, na Rosh, na Mupim, na Hupim, na Ad.
22. Ndia bu umu-ndikom Rechel, ndi amuru nye Jekob: nkpuru-obi nile di iri na anọ.
23. Umu-ndikom Dan; Hushim.
24. Umu-ndikom Naftali; Jahzeel, na Guni, na Jiza, na Shilem.
25. Ndia bu umu-ndikom Bilha, onye Leban nyere Rechel nwa-ya nwayi, ọ we muara Jekob ndia: nkpuru-obi nile di asa.
26. Nkpuru-obi nile Jekob nwere ndi batara n'Ijipt, ndi siri n'úkwù-ya puta, nāgughi nwunye nile nke umu Jekob, nkpuru-obi nile di ọgu atọ na isi;
27. umu-ndikom Josef, ndi amuru nye ya n'Ijipt, di kwa nkpuru-obi abua; nkpuru-obi nile nke ulo Jekob, ndi nābata n'Ijipt, di ọgu atọ na iri.
28. Ma ọ bu Juda ka o zigara n'iru ya jekuru Josef, igosi ya uzọ n'iru ya rue Goshen; ha we bata n'ala Goshen
29. Josef we dozie ub͕o-ala-ya, rigorue Goshen izute Israel, bú nna-ya; ọ me ka ọ hu ya anya, ọ we dakwasi ya n'olu, kwa ákwá n'olu-ya mb͕e di anya.
30. Israel we si Josef, Ka m'nwua ub͕u a, mb͕e m'husiri iru-gi, na i nọ ndu rue ub͕u a.
31. Josef we si umu-nne-ya, si kwa ulo nna-ya, M'gārigo, gosi Fero, si ya, Umu-nnem na ulo nnam, ndi nọ n'ala Kenean, abiakutewom;
32. ma ndikom ahu bu ndi-ọzùzù ìgwè ewu na aturu, n'ihi na ndi ọlu-ha bu iche anu-ulo ka ha bu-woro; ọ bu kwa ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha, na ihe nile ha nwere, ka ha chitaworo.
33. Ma o gēru, mb͕e Fero gākpọ unu, si kwa, Gini bu ọlu unu nālu?
34. na unu gāsi, Ndi ọlu-ayi bu iche anu-ulo ka ndi orù-gi buworo site na mb͕e ayi di na nwata we rue ub͕u a, ma ayi onwe-ayi, ma nna-ayi-hà: ka unu we biri n'ala Goshen; n'ihi na onye ọ bula nāzù ìgwè ewu na aturu bu ihe-árú n'anya ndi Ijipt.