isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma mb͕e Ọ huru ìgwè madu ahu, Ọ rigoro n'ugwu ahu: mb͕e Ọ nọduru ala, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya:

2. O we saghe ọnu-Ya, zí ha ihe, si,

3. Ngọzi nādiri ndi bu ob͕eye nime mọ-ha: n'ihi na ala-eze nke elu-igwe bu nke ndi ahu.

4. Ngọzi nādiri ndi nēru újú: n'ihi na ndi ahu ka agākasì obi.

5. Ngọzi nādiri ndi di nwayọ n'obi: n'ihi na ndi ahu gēketa uwa.

6. Ngọzi nādiri ndi agu ezi omume nāgu, ndi akpiri nākpọ kwa nku na ya: n'ihi na ndi ahu ka afọ gēju.

7. Ngọzi nādiri ndi-ebere: n'ihi na ndi ahu ka agēmere ebere.

8. Ngọzi nādiri ndi di ọcha n'obi: n'ihi na ndi ahu gāhu Chineke.

9. Ngọzi nādiri ndi nēme ka madu na ibe-ha di n'udo: n'ihi na ndi ahu ka agākpọ umu Chineke.

10. Ngọzi nādiri ndi esob͕uworo n'ihi ezi omume: n'ihi na ala-eze elu-igwe bu nke ndi ahu.

11. Ngọzi nādiri unu mb͕e ọ bula ha nāta unu uta, nēsob͕u kwa unu, nēkwu kwa ajọ ihe nile di iche iche megide unu n'okwu-ugha, n'ihim.

12. Ṅurianu ọṅu, ka obi tọ kwa unu utọ nke-uku: n'ihi na ugwọ-ọlu-unu di uku n'elu-igwe: n'ihi na otú a ka ha sob͕uru ndi-amuma ndi buru unu uzọ.

13. Unu onwe-unu bu nnú nke uwa: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, àgēji gini me ya ka ọ ghọ ezi nnú? ọ dighi kwa irè iji me ihe ọ bula ọzọ, ma-ọbughi ka etufue ya n'èzí, madu azọ ya ukwu.

14. Unu onwe-unu bu ìhè nke uwa. Apughi izo obodo nke ewuworo n'elu ugwu.

15. Ma ha adighi-amuye oriọna, dọba ya n'okpuru mb͕é, kama n'elu ihe-idọba-oriọna; ọ nēnwu-kwa-ra madu nile nọ n'ulo ahu.

16. Otú a menu ka ìhè-unu nēnwu n'iru madu, ka ha we hu ọlu ọma nile unu, we to Nna-unu Nke bi n'elu-igwe.

17. Unu echèla na abiaram imebi iwu Chineke ma-ọbu ndi-amuma-Ya: abiaghm imebi, kama imezu ya.

18. N'ihi na n'ezie asim unu, Rue mb͕e elu-igwe na ala gāgabiga, ọ dighi otù ihe ọ bula dikarisiri ntà gāgabiga n'iwu ma-ọli, rue mb͕e ihe nile gēme.

19. Ya mere onye ọ bula nke gēmebi otù nime ihe ndia dikarisiri ntà nke enyere n'iwu, nke gēzí kwa madu otú ahu, agākpọ ya onye dikarisiri ntà n'ala-eze elu-igwe: ma onye ọ bula nke gēme ha, zí kwa ha, onye ahu ka agākpọ onye uku n'ala-eze elu-igwe.

20. N'ihi na asim unu, na ọ buru na ezi omume-unu adighi-akari ezi omume ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nke-uku, unu agaghi-abà n'ala-eze elu-igwe ma-ọli.

21. Unu nuru na agwara ndi-ochie, si, Eb͕ula madu; ma onye ọ bula nke b͕uru madu gēnye onwe-ya n'aka ikpé:

22. ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n'aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n'aka nnọkọ-ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, Onye-nzuzù, gēnye onwe-ya n'aka ọku ala-mọ.

23. Ya mere ọ buru na i nēche onyinye-gi n'iru Chineke n'ebe-ichu-àjà, i we cheta n'ebe ahu na nwa-nne-gi nwere ihe megide gi,

24. rapu onyinye-gi n'ebe ahu n'iru ebe-ichu-àjà, laba, buru uzọ me ka gi na nwa-nne-gi di n'udo, mb͕e ahu bia kwa che onyinye-gi.

25. Me ka gi na onye nēkuru gi ga ikpé me eyì ọsọsọ, mb͕e gi na ya nọ n'uzọ; ka onye ahu nēkuru gi ga ikpe we ghara irara gi nye n'aka onye-ikpe ma eleghi anya, onye ikpe arara kwa gi nye n'aka onye nēje ozi, ewe tubà gi n'ulo-nkpọrọ.

26. N'ezie asim i, I gaghi-aputa n'ebe ahu ma-ọli, rue mb͕e i gākwughachi farthing ikpe-azu.

27. Unu nuru na ekwuru, si, Akwala iko:

28. ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nēle nwanyi anya ka agu ya we gua ya, ọ kwasiwo ya iko n'obi-ya ub͕u a.

29. Ma ọ buru na anya aka-nri gi eme gi ka i ma n'ọnyà, ghupu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: n'ihi na ọ bara gi urù ka otù nime ihe di gi n'aru la n'iyì, ka aghara kwa itubà aru-gi dum n'ọku ala-mọ.

30. Ma ọ buru na aka-nri-gi eme gi ka i ma n'ọnya, bipu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: n'ihi na ọ bara gi urù ka otù nime ihe di gi n'aru la n'iyì, ka aru-gi dum ghara kwa ije n'ọku ala-mọ.

31. Ekwu-kwa-ra, si, Nwoke ọ bula nke gārapu nwunye-ya, ya nye ya akwukwọ nkewa:

32. ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nārapu nwunye-ya, ma-ọbughi n'ihi ikwa-iko, ọ nēme nwanyi ahu ka ọ nọ n'ọnọdu onye akwara iko megide: onye ọ bula nke gālu kwa ya mb͕e arapusiri ya, ọ nākwa iko.

33. Ọzọ kwa, unu nuru na agwara ndi-ochie, si, Aṅula iyí ugha, kama nyeghachi Onye-nwe-ayi ihe nile i ṅuru n'iyí:

34. ma Mu onwem si unu, Aṅula iyí ma-ọli; ejila elu-igwe ṅu, n'ihi na ọ bu oche-eze Chineke;

35. eji-kwa-la ala, n'ihi na ọ bu ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Ya; aṅukwala iyí n'ebe Jerusalem di, n'ihi na ọ bu obodo nke Eze uku ahu.

36. Eji-kwa-la isi-gi ṅu iyí, n'ihi na i pughi ime otù agiri-isi ka ọ di ọcha ma-ọbu ka ọ di oji.

37. Ma ka okwu-unu buru, E, e; É-è, é-è: ma ihe ọ bula kariri ndia nēsite n'ajọ onye ahu.

38. Unu nuru na ekwuru, si, Anya lara anya, ezé lara ezé:

39. ma Mu onwem si unu, Eguzogidela onye bu ajọ onye: kama onye ọ bula nāku gi ura na ǹtì aka-nri, tughari-kwa-ra ya ǹtì ọzọ.

40. Ma ọ buru na onye ọ bula nāchọ ka gi na ya je ikpé, ka o we nara gi uwe-ime-gi, rapu-kwa-ra ya oké uwe-gi.

41. Onye ọ bula nke gējide gi ije otù mile, so ya je mile abua.

42. Nye onye nāriọ gi, ab͕akuta-kwa-la ya azú, bú onye nāchọ ka i binye ya ihe.

43. Unu nuru na ekwuru, si, Hu madu-ibe-gi n'anya, kpọ kwa onye-iro-gi asì:

44. ma Mu onwem si unu, Nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsob͕u unu;

45. ka unu we buru umu nke Nna-unu Nke bi n'elu-igwe: n'ihi na Ọ nēme ka anyanwu-Ya nāwakwasi ajọ madu na ezi madu, Ọ nēme kwa ka miri zokwasi ndi ezi omume na ndi ajọ omume.

46. N'ihi na ùnu nwere ugwọ-ọlu gini, ma ọ buru na unu huru ndi ahu n'anya, bú ndi nāhu unu n'anya? ọbuná ndi-ọna-utu, hà adighi-eme otù ihe ahu?

47. Ọ buru kwa na unu nēkele nání umu-nne-unu, gini ka unu nēme kari ndi ọzọ? ọbuná ndi mba ọzọ, hà adighi-eme otù ihe ahu?

48. Ya mere unu onwe-unu gēzu okè, dika Nna-unu nke elu-igwe zuru okè.