isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 9 Bible Nso (IGBOB)

1. O we ba nime ub͕ọ, gabiga n'ofè ọzọ, bia n'obodo nke aka Ya.

2. Ma le, ha butere Ya onye akuku-aru-ya nwuru anwu, tọb͕ọrọ n'ihe-ndina: mb͕e Jisus huru okwukwe-ha Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu, Nwa, nwe obi-ike; anāb͕aghara gi nmehie-gi nile.

3. Ma le, ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ kwuru nime onwe-ha, si, Nwoke a nēkwulu Chineke.

4. Ma Jisus, ebe ọ mara ihe nile di ha n'obi, Ọ si, Gini mere unu nēchè ajọ ihe n'obi-unu?

5. N'ihi na, òle nke ka nfe, isi, Anāb͕aghara gi nmehie-gi nile; ma-ọbu isi, Bilie, jeghari kwa?

6. Ma ka unu we mata na Nwa nke madu nwere ike n'elu uwa ib͕aghara nmehie (mb͕e ahu Ọ siri onye ahu ukwu-ya nwuru anwu), Bilie, chiri ihe-ndina-gi, la n'ulo-gi.

7. O we bilie, la n'ulo-ya.

8. Ma mb͕e ìgwè madu nile huru ya, ha turu egwu, we nye Chineke otuto, Onye nyere madu ike di otú a.

9. Mb͕e Jisus nēsi n'ebe ahu nāga, Ọ huru otù nwoke, anākpọ Matiu, ka ọ nọduru n'ulo-ùtú: Ọ si ya, Som. O we bilie, so Ya.

10. O rue, mb͕e Ọ nọduru na nri n'ulo-ya, le, ọtutu ndi-ọna-utu na ndi-nmehie biara so Jisus na ndi nēso uzọ-Ya nọdu na nri.

11. Mb͕e ndi-Farisi huru ya, ha we si ndi nēso uzọ-Ya, N'ìhi gini ka Onye-ozizí-unu nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ndia eri ihe?

12. Ma mb͕e Ọ nuru ya, Ọ si, Nkpà dibia akpaghi ndi di ike, kama ọ nākpà ndi aru nādighi nma.

13. Ma ganu muta ihe okwu a bu, Anamachọ ebere, ọ bughi àjà: n'ihi na abiaghm ikpọ ndi ezi omume, kama ọ bu ndi-nmehie.

14. Mb͕e ahu ndi nēso uzọ Jọn biakutere Ya, si, N'ìhi gini ka ayi onwe-ayi na ndi-Farisi nēbu ọnu ọtutu mb͕e, ma ndi nēso uzọ-Gi adighi-ebu ọnu?

15. Jisus we si ha, Umu-ndikom nke ulo anālu nwunye ọhu, ọ̀ gābu na ha puru iru újú ka oge ahu ra, bú mb͕e ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ? ma ubọchi gābia, mb͕e agānapu ha Onye nālu nwunye ọhu, mb͕e ahu ka ha gēbu kwa ọnu.

16. Ọ dighi kwa onye ọ bula nēwere iberibe ákwà ọb͕ub͕a ọhu tukwasi n'uwe ochie; n'ihi na nke kwesiri ímechi ya nādọkapu ihe n'aru uwe ahu, ndọka jọkariri njọ aputa.

17. Ha adighi-ab͕aye kwa manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie: eme otú a, karama-akpukpọ ahu ab͕awa, manya-vine ahu we wusì, karama-akpukpọ ahu ala kwa n'iyì: ma ha nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu, anēdebe ha abua nke-ọma.

18. Mb͕e Ọ nāgwa ha okwu ndia, le, otù onye-isi biara, we kpọ isi ala nye Ya, si, Nwam nwayi anwuruwo ọbuná ub͕u a: otú ọ di, bia bikwasi ya aka-Gi, na ọ gādi ndu.

19. Jisus we bilie, so ya je, ndi nēso uzọ-Ya so-kwa-ra.

20. Ma le, otù nwanyi, nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, biara n'azu Ya, we metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka:

21. n'ihi na ọ nāsi n'onwe-ya, Ọ buru na emetum nání uwe-Ya aka, agāzọputam.

22. Ma Jisus chighariri, we hu ya, si, Nwam nwanyi, nwe obi-ike; okwukwe-gi azọputawo gi. Ewe site n'oge hour ahu zọputa nwanyi ahu.

23. Mb͕e Jisus biara n'ulo onye-isi ahu, hu ndi-ọkwa-ọ̀jà, na ìgwè madu ka ha nātu ùzù,

24. Ọ si, Wezuganu onwe-unu; n'ihi na nwa-ab͕ọghọ ntà ahu anwughi anwu, kama ọ nāraru ura. Ha we chìa Ya ọchì.

25. Ma mb͕e achupuru ìgwè madu ahu, Ọ ba nime, jide ya n'aka; nwa-ab͕ọghọ ntà ahu we bilie.

26. Ùdé a we pua gazue n'ala ahu dum.

27. Mb͕e Jisus nēsi n'ebe ahu nāga, ndi-ìsì abua we so Ya, nēti nkpu, si, Mere ayi ebere, Nwa Devid.

28. Ma mb͕e Ọ batasiri n'ulo, ndi-ìsì ahu biakutere Ya: Jisus we si ha, Ùnu kwere na apurum ime ihe a? Ha si Ya, E, Onye-nwe-ayi.

29. Mb͕e ahu O meturu anya-ha aka, si, Dika okwukwe-unu si di ka emere unu.

30. Ewe saghe anya-ha. Jisus we dọ ha aka na nti nke-uku, si, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara ima ya.

31. Ma ha puru, b͕asa ùdé-Ya n'ala ahu dum.

32. Mb͕e ha nāpu, le, ekutara Ya onye-ob͕i nke mọ ọjọ ji.

33. Mb͕e achupusiri mọ ọjọ ahu, onye-ob͕i ahu we kwue okwu: ibobo we nwua ìgwè madu nile n'aru, ha si, Ọ dighi mb͕e ọ bula egosiri ya otú a n'Israel.

34. Ma ndi-Farisi nāsi, N'ike onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ.

35. Jisus we nējeghari n'obodo na obodo ntà ha nile, nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche.

36. Ma mb͕e Ọ huru ìgwè madu nile, O nwere ọmiko n'aru ha, n'ihi na anēsob͕u ha, nāchusa kwa ha, dika aturu nēnweghi onye nāzù ha.

37. Mb͕e ahu Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Owuwe-ihe-ubi riri nne n'ezie, ma ndi-ọlu di ole-na-ole.

38. Ya mere, nāriọnu Onye-nwe owuwe-ihe-ubi ahu, ka O zipu ndi-ọlu bà n'owuwe-ihe-ubi-Ya.