isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 20 Bible Nso (IGBOB)

1. N'ihi na ala-eze elu-igwe yiri nwoke nke bu nna-nwe-ulo, onye puru n'isi-ututu igota ndi-ọlu ije n'ubi-vine-ya.

2. Ma mb͕e ya na ndi-ọlu ahu nwere otù olu ka o nye ha otù shilling kwa-ubọchi, o zigara ha n'ubi-vine ya.

3. Ọ we pua dika oge hour nke-atọ, hu ndi ọzọ ka ha nēguzo n'ọma-ahia nālughi ọlu;

4. o we si ndi ahu, Unu onwe-unu ga kwa n'ubi-vine nkem, ihe ọ bula ziri ezi ka m'gēnye unu. Ha we je.

5. Ọ we pu kwa ọzọ dika oge hour nke-isi na nke-iteghete, me kwa otú ahu.

6. Ọ we pua dika oge hour nke-iri-na-otù, hu ndi ọzọ ka ha nēguzo; ọ si ha, Gini mere unu guzoro n'ebe a ubọchi dum nālughi ọlu?

7. Ha si ya, N'ihi na ọ dighi onye ọ bula goro ayi ilu ọlu. Ọ si ha, Unu onwe-unu ga kwa n'ubi-vine nkem.

8. Ma mb͕e o ruru anyasi, onye-nwe ubi-vine ahu si onye o tiyere ihe-ya n'aka, Kpọ ndi-ọlu ahu, kwua ha ugwọ-ọlu-ha, malite site na ndi-ikpe-azu rue ndi bu uzọ.

9. Mb͕e ndi egoro n'oge hour nke-iri-na-otù biara, ha we nata otù onye otù shilling.

10. Ma mb͕e ndi bu uzọ biara, ha chère na ha gānata nke ka; ma ha onwe-ha nata-kwa-ra otù onye otù shilling.

11. Ma mb͕e ha natara ya, ha tamube megide nna-nwe-ulo ahu,

12. si, Ndi-ikpe-azu a luru otù hour, i we me ka ayi na ha ra, ayi ndi būru ibu arọ́ nke ubọchi ta, ya na ifufe di ọku.

13. Ma ọ zara otù onye nime ha, si, Eyìm, emejọghm i: mù na gi enweghi otù olu ka m'nye gi otù shilling?

14. Welie nke bu nke gi, la; anamachọ ka m'nye onye-ikpe-azu a dika m'nye-kwa-ra gi.

15. Ò zighi ezi n'iwu ka m'were ihe nile nkem me ihe m'nāchọ? ma-ọbu ànya-gi jọrọ njọ, n'ihi na mu onwem bu ezi madu?

16. Otú a ndi-ikpe-azu gēbu uzọ, ndi bu uzọ gābu kwa ndi-ikpe-azu.

17. Mb͕e Jisus nārigoro Jerusalem, O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu iche, bú ndi nēso uzọ-Ya, tiyere Onwe-ya, O we si ha n'uzọ,

18. Le, ayi nārigoro Jerusalem; agārara kwa Nwa nke madu nye n'aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ; ha gāma kwa Ya ikpé ọnwu,

19. rara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ ka ha me Ya ihe-ọchì, pia Ya ihe, kpọgide Ya n'obe: agēme kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ.

20. Mb͕e ahu nne umu Zebedi biakutere Ya, ya na umu-ya ndikom, nākpọ isi ala nye Ya, nāriọ kwa Ya ihe n'aka.

21. O we si ya, Gini ka i nāchọ? Ọ si Ya, Kwue ka umum ndikom abua ndia nọdu, otù n'aka-nri-Gi, otù n'aka-ekpe-Gi, n'ala-eze-Gi.

22. Ma Jisus zara, si, Unu amataghi ihe unu nāriọ. Ùnu puru iṅu iko ahu nke Mu onwem gaje iṅu? Ha si Ya, Ayi puru.

23. Ọ si ha, Ikom ka unu gāṅu n'ezie: ma inọdu n'aka-nrim, na n'aka-ekpem, abughi nkem inye, kama ọ diri ndi Nnam doziworo ya.

24. Ma mb͕e ndi-ozi iri fọduru nuru ya, iwe were ha nke-uku n'ihi umu-nne abua ahu.

25. Ma Jisus kpọrọ ha biakute Ya, si, Unu amatawo na ndi bu isi nke mba nile ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha: ndi uku ha nāchi kwa ha.

26. Ọ bughi otú a ka ọ gādi n'etiti unu: kama onye ọ bula nke nāchọ ka eme ya onye uku n'etiti unu, ọ gābu onye nējere unu ozi;

27. ọzọ, onye ọ bula nke nāchọ ka ọ buru onye-isi n'etiti unu, ọ gābu orù-unu:

28. dika Nwa nke madu abiaghi ka ejere Ya ozi, kama ka O je ozi, ka O were kwa ndu-Ya nye ka ọ buru ihe-nb͕aputa n'ọnọdu ọtutu madu.

29. Mb͕e ha nāputa na Jeriko, oké ìgwè madu we so Ya.

30. Ma le, ndi-ìsì abua ndi nānọdu n'akuku uzọ, mb͕e ha nuru na Jisus nāgabiga, ha tie nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid.

31. Ìgwè madu ahu we bara ha nba, ka ha kpuchie ọnu-ha: ma ha tikariri nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid.

32. Jisus we guzo, kpọ ha, we si, Gini ka unu nāchọ ka M'mere unu?

33. Ha si Ya, Onye-nwe-ayi, ka ewe meghe anya-ayi.

34. Ma Jisus, ebe O nwere ọmiko n'aru-ha, O we metu anya-ha aka: ngwa ngwa ewe me ka ha hu uzọ, ha we so Ya.