isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 15 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e ahu ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ siri na Jerusalem biakute Jisus, si,

2. N'ìhi gini ka ndi nēso uzọ-Gi nējehie n'ozizí ndi-okenye nyere ayi n'aka idebe? n'ihi na ha adighi-akwọ aka mb͕e ọ bula ha nēri nri.

3. Ma Ọ zara, si ha, N'ìhi gini ka unu onwe-unu nējehie kwa n'ihe Chineke nyere n'iwu n'ihi ozizí enyere unu n'aka?

4. N'ihi na Chineke siri, Sọpuru nna-gi na nne-gi: na, Onye kwujọrọ nna maọbu nne, ya nwua ọnwu ahu.

5. Ma unu onwe-unu nāsi, Onye ọ bula nke gāsi nna-ya ma-ọbu nne-ya, Ihe ọ bula i gēritari n'akam bu ihe enyere Chineke;

6. ọ gaghi-asọpuru nna-ya ma-ọbu nne-ya ma-ọli. Unu nēme kwa okwu Chineke ka ọ buru ihe-efu n'ihi ozizí enyere unu n'aka idebe.

7. Ndi-iru-abua, Aisaia buru amuma nke-ọma bayere unu, si,

8. Ndi nka nāsọpurum n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha;Ma obi-ha di anya n'ebe M'nọ.

9. Ma ha nēbirim isi ala n'efu,Nēzì ihe madu nyere n'iwu ka ha buru ozizí-ha.

10. O we kpọ ìgwè madu ahu biakute Ya, Ọ si ha, Nurunu, ghọta-kwa-nu:

11. Ọ bughi ihe nābà n'ọnu nēmeru madu; kama ihe si n'ọnu puta, ọ bu nke ahu nēmeru madu.

12. Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya biakutere Ya, si Ya, Ì matawo na emere ka ndi-Farisi ma n'ọnyà, mb͕e ha nuru okwu ahu?

13. Ma Ọ zara, si, Agēropu ihe-ọkukú ọ bula nke Nnam nke elu-igwe nākughi.

14. Rapunu ha: ha bu ndi-ndú kpuru ìsì. Ma ọ buru na onye-ìsì edu onye-ìsì, ha abua gādabà n'olùlù.

15. Pita we za, si Ya, Kọrọ ayi isi ilu a.

16. O we si, Ùnu onwe-unu di kwa nēnweghi nghọta we rue ub͕u a?

17. Ùnu atugharighi uche-unu na ihe ọ bula nke nābà n'ọnu nāga n'afọ, ewe nyupu ya n'ulo-ǹsí?

18. Ma ihe nke si n'ọnu puta nēsi nime obi aputa; ihe ndia nēmeru kwa madu.

19. N'ihi na n'obi ka ajọ èchìchè nile, ib͕u-madu nile, ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, ikwa-iko nile, ori nile, àmà ugha nile, nkwulú nile, si aputa:

20. ndia bu ihe nēmeru madu: ma iwere aka anākwọghi akwọ iri ihe adighi-emeru madu.

21. Jisus we si n'ebe ahu pua, wezuga Onwe-ya ga n'akuku Taia na Saidon.

22. Ma le, otù nwanyi Kenean siri n'ókè-ala ahu puta, tie nkpu, si, Merem ebere, Onye-nwe-ayi, Nwa Devid; mọ ọjọ nējisi nwam nwanyi ike.

23. Ma Ọ zaghi ya okwu ọ bula. Ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, nēkpere Ya, si, Zilaga ya; n'ihi na ọ nētiso ayi nkpu.

24. Ma Ọ zara, si, Eziteghm ma-ọbughi ijekuru aturu furu efu nke ulo Israel.

25. Ma nwanyi ahu biara nākpọ isi ala nye Ya, si, Onye-nwe-ayi, yerem aka.

26. Ma Ọ zara, si, Ọ dighi nma inara nri umu tupuru umu-nkita.

27. Ma ọ siri, E, Onye-nwe-ayi: n'ihi na ọbuná umu-nkita nēri ufọdu nime irighiri nke nādaputa na table nke ndi-nwe-ha.

28. Mb͕e ahu Jisus zara, si ya, Nwayi, okwukwe-gi di uku: ka emere gi dika i nāchọ. Ewe me ka aru di nwa-ya nwanyi ike site n'oge hour ahu.

29. Jisus we si n'ebe ahu pua bia n'usọ osimiri Galili; O we rigo n'ugwu ahu, we nọdu n'ebe ahu.

30. Ọtutu ìgwè madu we biakute Ya, chiri ndi-ngwurọ, ndi-ìsì, ndi-ob͕i, ndi-ọlusi, na ọtutu ndi-ọria di iche, tiyere onwe-ha, ha we tọb͕ọ ha n'ala n'ukwu-Ya; O we me ka aru-ha di ike:

31. ya mere na o juru ìgwè madu ahu anya, mb͕e ha huru ndi-ob͕i ka ha nēkwu okwu, na ndi-ọlusi ka aru-ha di nma, na ndi-ngwurọ ka ha nēje ije, na ndi-ìsì ka ha nāhu uzọ: ha we to Chineke nke Israel.

32. Jisus we kpọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, Ọ si, Enwerem ọmiko n'aru ìgwè madu a, n'ihi na Mu na ha nọgidere ubọchi atọ ub͕u a, ha enweghi kwa ihe ha gēri: ma achọghm izilaga ha n'ọnu efu, ka ha ghara ida #mbà n'uzọ ma eleghi anya.

33. Ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Òle ebe ka ayi gēsi nwe ọtutu ob͕e achicha ra otú a n'ọhia, inyeju oké ìgwè madu di otú a afọ?

34. Jisus we si ha, Ùnu nwere ob͕e achicha ole? Ha we si, Asa, na azù ntà ole-na-ole.

35. O we gwa ìgwè madu ahu ka ha nọdu ala;

36. O we nara ob͕e achicha asa ahu na azù ahu; mb͕e O kelesiri ekele, Ọ nyawa ha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya, ndi nēso uzọ-Ya nēnye kwa ìgwè madu nile.

37. Ha nile we rie, afọ ju kwa ha: ha we tutukọ nke fọduru nime iberibe ahu, abọ asa juru.

38. Ma ndi riri bu nnù ndikom iri, nāgughi ndinyom na umuaka.

39. Mb͕e O zilagasiri ìgwè madu nile, Ọ ba n'ub͕ọ ahu, bia n'ókè-ala Magadan.