isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehemaia 3 Bible Nso (IGBOB)

1. Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà, we bilie, ya na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, ha we lua ọnu-uzọ-ama aturu; ha onwe-ha doro ya nsọ, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya; ọbuná rue ulo-elu Hamea ka ha doro ya nsọ, rue ulo-elu Hananel.

2. N'akuku ya ka ndikom Jeriko luru. N'akuku ha ka Zakua nwa Imri luru.

3. Ọnu-uzọ-ama azù ka umu Hasenaa luru; ndi ahu jikọtara ya n'otù, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile.

4. N'akuku ha ka Meremot nwa Uraia, nwa Hakoz, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ha ka Meshulam nwa Berekaia, nwa Meshezabel, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ha ka Zedok nwa Beana mere ka mb͕idi di ike.

5. N'akuku ha ka ndi Tekoa mere ka mb͕idi di ike; ma ndi-ha ndi di ebube etiyeghi olu-ha n'òfùfè Onye-nwe-ha.

6. Ọnu-uzọ-ama ochie ka Joiada nwa Pasea na Meshulam nwa Besodeia mere ka ọ di ike; ndi ahu jikọtara ya n'otù, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile.

7. N'akuku ha ka Melataia, bú onye Gibeon, na Jadon, bú onye Meronot, ndikom Gibeon na Mizpa, mere ka mb͕idi di ike rue oche-eze nke onye nāchi ala n'ofè osimiri.

8. N'akuku ya ka Uziel nwa Hahaia, bú ndi-nnucha-ọla, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ya ka Hananaia, bú otù onye nime ndi nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ, mere ka mb͕idi di ike, ha we rapu Jerusalem rue mb͕idi di obosara.

9. N'akuku ha ka Refaia nwa Hua, bú onye-isi nkera ala di Jerusalem buruburu, mere ka mb͕idi di ike.

10. N'akuku ha ka Jedaia nwa Harumaf mere ka mb͕idi di ike, bú na ncherita-iru ulo-ya. N'akuku ya ka Hatush nwa Hashabneia mere ka mb͕idi di ike.

11. Malkija nwa Harim na Hashub nwa Pahat-moab mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, bú ulo-elu nke ite-ọku uku.

12. N'akuku ya ka Shalum nwa Halohesh, bú onye-isi nkera ala di Jerusalem buruburu, mere ka mb͕idi di ike, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom.

13. Ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu ka Hanun na ndi bi na Zanoa mere ka ọ di ike; ndi ahu luru ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na nnù cubit mb͕idi abua na ọgu iri rue ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia.

14. Ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia ka Malkija nwa Rikab, bú onye-isi ala di Bet-hakerem buruburu, mere ka ọ di ike; onye ahu luru ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile.

15. Ọnu-uzọ-ama isi-iyi ka Shalun nwa Kọl-hoze, bú onye-isi ala di Mizpa buruburu, mere ka ọ di ike; onye ahu luru ya, kpue ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na mb͕idi ọdọ-miri Shela, rue ubi eze ab͕ara ogige, ru kwa ihe-nrigo nke nēsi n'obodo Devid rida.

16. N'iso ya ka Nehemaia nwa Azbuk, bú onye-isi nkera ala di Bet-zua buruburu, mere ka mb͕idi di ike, rue na ncherita-iru ílì Devid, ru kwa ọdọ-miri nke emere, ru kwa ulo ndi-dike.

17. N'iso ya ka ndi Livai, Rehum nwa Bani, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ya ka Hashabaia, bú onye-isi nkera ala di Keila buruburu, mere ka mb͕idi diri buruburu-ala-ya ike.

18. N'iso ya ka umu-nne-ha, na Bavai nwa Henadad, bú onye-isi nkera ala di Keila buruburu, mere ka mb͕idi di ike.

19. N'akuku ya ka Eza nwa Jeshua, bú onye-isi Mizpa, mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site na ncherita-iru nrigo ulo-ihe-ekike-agha na nkuku mb͕idi.

20. N'iso ya ka Beruk nwa Zabai nuru ọku n'obi ime iberibe ọzọ atùru atù di ike, site na nkuku mb͕idi rue ọnu-uzọ ulo Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà.

21. N'iso ya ka Meremot nwa Uraia nwa Hakoz mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site n'ọnu-uzọ ulo Elaiashib we rue nsọtu ulo Elaiashib.

22. N'iso ya ka ndi-nchu-àjà, bú ndikom nke Buruburu-ala, mere ka mb͕idi di ike.

23. N'iso ha ka Benjamin na Hashub mere ka mb͕idi di ike na ncherita-iru ulo-ha. N'iso ha ka Azaraia nwa Maaseia nwa Ananaia mere ka mb͕idi di ike n'akuku ulo-ya.

24. N'iso ya ka Binui nwa Henadad mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site n'ulo Azaraia rue nkuku mb͕idi, ọbuná rue ulo-elu nkuku.

25. Palal nwa Uzai mere ka mb͕idi di ike site na ncherita-iru nkuku mb͕idi, na ulo-elu nke nāputa n'ulo di n'elu nke eze, bú nke di nso ogige ulo-nche. N'iso ya ka Pedaia nwa Parosh mere ka mb͕idi di ike.

26. (Ma Netinim nēbi n'Ofel, rue na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama miri n'akuku ọwuwa-anyanwu, na ulo-elu nke nāputa aputa.)

27. N'iso ya ka ndi Tekoa mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site na ncherita ulo-elu di uku nke nāputa aputa, we rue mb͕idi Ofel.

28. Site n'elu ọnu-uzọ-ama inyinya ka ndi-nchu-àjà mere ka mb͕idi di ike, nwoke ọ bula na ncherita-iru ulo-ya.

29. N'iso ha ka Zedok nwa Imea mere ka mb͕idi di ike na ncherita-iru ulo-ya. N'iso ya ka Shemaia nwa Shekania, bú onye nēche ọnu-uzọ-ama ọwuwa-anyanwu, mere ka mb͕idi di ike.

30. N'iso ya ka Hananaia nwa Shelemaia, na Hanum, bú nwa nke-isi nke Zalaf, mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike. N'iso ya ka Meshulam nwa Berekaia mere ka mb͕idi di ike na ncherita-iru ime-ulo-ya.

31. N'iso ya ka Malkija, bú otù onye nime ndi-nnucha-ọla, mere ka mb͕idi di ike rue ulo Netinim, na nke ndi nāzu ahia, na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama Hamifkad, ru kwa nrigo ulo-elu nkuku.

32. N'etiti nrigo ulo-elu nkuku na ọnu-uzọ-ama aturu ka ndi-nnucha-ọla na ndi nāzu ahia mere ka ọ di ike.