isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehemaia 2 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue n'ọnwa Nisan, n'arọ nke-orú nke Ataksakses, bú eze, na manya-vine di n'iru ya, m'we buru manya-vine ahu, nye eze. Ma akaghm-ajọ njọ n'obi n'iru ya.

2. Eze we sim, Gini mere iru-gi jọrọ njọ, ma gi onwe-gi adighi-aria ọria? nka abughi ihe ọzọ, ọ bu nání obi jọrọ njọ. M'we tua egwu ri nne nke-uku.

3. M'we si eze, Ka eze di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: gini mere irum agaghi-eji jọ njọ, mb͕e obodo ahu, bú ulo nke ílì nnam-hà, bu nkpọnkpọ ebe, eripiawo kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile n'ọku?

4. Eze we sim, Ọ̀ bu gini kwa ka gi onwe-gi nāchọ? M'we kpere Chineke nke elu-igwe.

5. M'we si eze, Ọ buru na ọ di eze nma, ọ buru kwa na orù-gi di nma n'anya-gi, ọ bu ka i zigam na Juda, rue obodo ílì nnam-hà, ka m'we wue ya.

6. Eze we sim, (nwunye eze nānọdu kwa n'akuku ya,) Rùe ole mb͕e ka ije-gi gādi? òle mb͕e ka i gālaghachi kwa? O we di nma n'anya eze, o we zigam; m'we nye ya oge.

7. M'we si eze, Ọ buru na ọ di eze nma, ka enyem akwukwọ-ozi inye ndi nāchi ala n'ofè osimiri, ka ha kwe ka m'gabiga rue mb͕e m'batara Juda;

8. na akwukwọ-ozi inye Esaf, bú onye nēche ogige ọma nke eze nwere, ka ọ nyem osisi ijikọta ọnu-uzọ-ama nile nke ulo uku ahu n'otù nke diri ulo ahu, na ijikọta mb͕idi obodo n'otù, na ijikọta ulo n'otù, bú nke m'gābà nime ya. Eze we nyem, dika ezi aka Chinekem si di n'arum.

9. M'we biakute ndi nāchi ala n'ofè osimiri, m'we nye ha akwukwọ-ozi eze. Ma eze zìri ndi-isi usu-ndi-agha na ndi-inyinya isom je.

10. Sanbalat, bú onye Horonaim, na Tobaia, bú orù, bú onye Amon, we nu ya, o we di ha njọ nke-uku na madu abiawo ichọrọ umu Israel ọdi-nma.

11. M'we bata Jerusalem, nọ n'ebe ahu ubọchi atọ.

12. M'we bilie n'abali, mu onwem na ndikom ole-na-ole sorom; ma egosighm madu ọ bula ihe Chinekem nētiye n'obim imere Jerusalem: ọ dighi kwa anu-ulo di n'ebe m'nọ, ọ bu nání anu-ulo ahu nke m'nānọkwasi ya.

13. M'we si n'ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu pua n'abali, we rue n'iru isi-iyi dragon, ru kwa ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia, we le mb͕idi Jerusalem nile anya, bú nke etipúsiri etipú, ọku eripiawo kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile.

14. M'we gabiga rue ọnu-uzọ-ama isi-iyi, ru kwa ọdọ-miri eze: ọ dighi kwa ebe anu-ulo nke di n'okpurum gāgabiga.

15. M'we nārigo na miri-iyi n'abali, m'we nēle mb͕idi ahu anya; m'we chigharia, ba n'ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu, we laghachi.

16. Ma ndi nọchiri anya eze amaghi ebe m'jere, ma-ọbu ihe mu onwem nēme; egosighkwam ndi-Ju rue ub͕u a, egosighkwam ndi-nchu-àjà, egosighkwam ndi amara aha-ha, egosighkwam ndi nọchiri anya eze, egosighkwam ndi fọduru ndi nēje ozi ahu.

17. M'we si ha, Unu onwe-unu nāhu ọnọdu ọjọ nke ayi onwe-ayi nọ nime ya, na Jerusalem bu nkpọnkpọ ebe, na esure-kwa-ra ọnu-uzọ-ama-ya nile n'ọku: bianu ka ayi wue mb͕idi Jerusalem, ka ayi we ghara ibu kwa ihe-ita-uta ọzọ.

18. M'we gosi ha aka Chineke nke di nma n'arum; na okwu nile nke eze kwa nke ọ gwaram. Ha we si, Ka ayi bilie lua mb͕idi. Ha we me ka aka-ha di ike ime ezi ihe a.

19. Sanbalat, bú onye Horonaim, na Tobaia, bú orù, bú onye Amon, na Geshem, bú onye Arebia, we nu ya, ha we chìa ayi ọchì, leda ayi anya, si, Gini bu ihe a nke unu onwe-unu nēme? ọ̀ bu eze ka unu nānupu isi imegide?

20. M'we zaghachi ha okwu, si ha, Chineke nke elu-igwe, Ya onwe-ya gēme ka ihe gara ayi nke-ọma; ayi onwe-ayi, bú ndi-orù-Ya, gēbili kwa lua mb͕idi: ma unu enweghi òkè, ma-ọbu ọnọdu ziri ezi, ma-ọbu ihe-ncheta, nime Jerusalem.