isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehemaia 7 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e alusiri mb͕idi ahu, mb͕e m'guzosi-kwa-ra ibo-ọnu-uzọ-ya nile, mb͕e emesi-kwa-ra ndi-ọnu-uzọ-ama na ndi-ọbù-abù na ndi-Livai ka ha lekọta ozi-ha,

2. na m'nyere Hanani, bú nwa-nnem, na Hananaia, bú onye-isi ulo uku eze, iwu bayere Jerusalem: n'ihi na onye ahu bu onye ezi-okwu, ọ nātu kwa egwu Chineke kari ọtutu madu.

3. M'we si ha, Ka aghara imeghepu ọnu-uzọ-ama Jerusalem rue mb͕e anyanwu di ọku; na mb͕e ndi-nche nēguzo kwa na nche-ha, ka ha mechie uzọ, kpọchi-kwa-nu ha: guzo kwa ndi bi na Jerusalem na nche, nwoke ọ bula nime nche-ya, nwoke ọ bula kwa na ncherita-iru ulo-ya.

4. Ma obodo ahu sara mbara n'aka abua, di kwa uku: ma ndi-ayi di ole-na-ole n'etiti ya, ulo adighi kwa nke ewuru ewu.

5. Chinekem we tiye ya n'obim, m'we chikọta ndi amara aha-ha, na ndi nọchiri anya eze, na ndi-ayi nile, ka ewe de ha n'akwukwọ-osuso-ọmumu. M'we chọta akwukwọ osuso-ọmumu nke ndi rigotaworo na mbu, m'we hu ihe a edeworo nime ya:

6. Ndia bu umu ala ahu anāchi achi, ndi nārigo, bú ndi sitere na ndọta-n'agha ahu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha je biri n'ala ọzọ, ha we lata na Jerusalem, lata kwa na Juda, nwoke ọ bula n'obodo-ya;

7. ndi nābia, ha na Zerubabel, na Jeshua, na Nehemaia, na Azaraia, na Raamia, na Nahamani, na Mọdekai, na Bilshan, na Misperet, na Bigvai, na Nehum, na Beana. Ọnu-ọgugu ndikom nke ndi Israel:

8. Umu Parosh, nnù ise na ọgu asatọ na iri na abua.

9. Umu Shefataia ọgu iri-na-asatọ na iri na abua.

10. Umu Ara, nnù na ọgu iri-na-abua na iri na abua.

11. Umu Pahat-moab, nke umu Jeshua na Joab, nnù asa na iri na asatọ.

12. Umu Ilam, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ.

13. Umu Zatu, nnù abua na ọgu abua na ise.

14. Umu Zakai, nnù na ọgu iri-na-asatọ.

15. Umu Binui, nnù na ọgu iri-na-abua na asatọ.

16. Umu Bebai, nnù na ọgu iri-na-otù na asatọ.

17. Umu Azgad, nnù ise na ọgu iri-na-isi na abua.

18. Umu Adonikam, nnù na ọgu iri-na-atọ na asa.

19. Umu Bigvai, nnù ise na ọgu atọ na asa.

20. Umu Adin, nnù na ọgu iri-na-abua na iri na ise.

21. Umu Atea, nke Hezekaia, ọgu anọ na iri na asatọ.

22. Umu Hashum, ọgu iri-na-isi na asatọ.

23. Umu Bezai, ọgu iri-na-isi na anọ.

24. Umu Harif, ọgu ise na iri na abua.

25. Umu Gibeon, ọgu anọ na iri na ise.

26. Ndikom Bet-lehem na Netofa, ọgu iteghete na asatọ.

27. Ndikom Anatot, ọgu isi na asatọ.

28. Ndikom Bet-azmavet, ọgu abua na abua.

29. Ndikom Kiriat-jearim na Kefira na Beirot, nnù na ọgu iri-na-asa na atọ.

30. Ndikom Rema na Geba, nnù na ọgu iri-na-otù na otù.

31. Ndikom Mikmas, ọgu isi na abua.

32. Ndikom Bet-el na Ai, ọgu isi na atọ.

33. Ndikom Nebo nke-ọzọ, ọgu abua na iri na abua.

34. Umu Ilam nke-ọzọ, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ.

35. Umu Harim, ọgu iri-na-isi.

36. Umu jeriko, ọgu iri-na-asa na ise.

37. Umu Lod na Hadid na Ono, nnù n' ọgu na iri-na-isi na otù.

38. Umu Senaa, nnù iteghete na ọgu iri-na-isi na iri.

39. Ndi-nchu-àjà: umu Jedaia, nke ulo Jeshua, nnù abua na ọgu asatọ na iri na atọ.

40. Umu Imea, nnù abua na ọgu iri-na-abua na iri na abua.

41. Umu Pashua, nnù atọ na ọgu abua na asa.

42. Umu Harim, nnù abua na ọgu iri na iri na asa.

43. Ndi Livai: umu Jeshua, nke Kadmiel, nke umu Hodeva, ọgu atọ na iri na anọ.

44. Ndi ọbù-abù: umu Esaf, ọgu asa na asatọ.

45. Ndi-ọnu-uzọ-ama: umu Shalum, na umu Atea, na umu Talmon, na umu Akub, na umu Hatita, na umu Shobai, ọgu isi na iri na asatọ.

46. Netinim: umu Ziha, na umu Hasufa, na umu Tabaot;

47. na umu Keros, na umu Sia, na umu Padon;

48. na umu Lebana, na umu Hagaba, na umu Salmai;

49. na umu Hanan, na umu Gidel, na umu Gaha;

50. na umu Reaia, na umu Rezin, na umu Nekoda;

51. na umu Gazam, na umu Uza, na umu Pasea;

52. na umu Besai, na umu Meunim, na umu Nefushesim;

53. na umu Bakbuk, na umu Hakufa, na umu Hahua;

54. na umu Bazlit, na umu Mehida, na umu Hasha;

55. na umu Bakos, na umu Sisera, na umu Tema;

56. na umu Nezia, na umu Hatifa.

57. Umu ndi-orù Solomon: umu Sotai, na umu Soferet, na umu Perida;

58. na umu Jaala, na umu Dakon, na umu Gidel;

59. na umu Shefataia, na umu Hatil, na umu Pokeret-hazebaim, na umu Emon.

60. Netinim nile, na umu ndi-orù Solomon, di ọgu iri-na-iteghete na iri na abua.

61. Ndia bu kwa ndi nārigo site na Tel-mela na Tel-hasha na Kerub na Adon na Imea: ma ha apughi igosi ulo nke ndi bu nna-ha, ma-ọbu nkpuru-ha, ma ọ bu Israel ka ha siri puta:

62. umu Delaia, na umu Tobaia, na umu Nekoda, nnù na ọgu iri-na-abua na abua.

63. Site kwa na ndi-nchu-àjà: umu Họbaia, na umu Hakoz, na umu Bazilai, onye luru nwunye sitere n'umu-ndinyom Bazilai, bú onye Gilead, ewe kpọ ya aha n'aha-ha.

64. Ndia chọrọ odide-akwukwọ-ha n'etiti ndi edere n'akwukwọ-osuso-ọmumu, ma achọtaghi ya: ewe gua ha na ndi nādighi nsọ, ewe wepu ha n'ọlu-nchu-àjà.

65. Tiashata we si ha, ka ha ghara iri ihe n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, rue mb͕e onye-nchu-àjà gēwere Ìhè na Izu-okè guzo.

66. Nkpọkọta ahu nile n'otù di orú nnù uzọ ise na nnù ise na ọgu iri-na-asatọ,

67. nāgughi orù-ha ndikom na orù-ha ndinyom, ndi di nnù iri-na-asatọ na ọgu isi na iri na asa: ha nwe-kwa-ra ọgu madu iri-na-abua na ise bu ndikom nābù abù na ndinyom nābù abù.

68. Inyinya-ha di nnù na ọgu iri-na-isi na iri na isi; inyinya mule ha di ọgu iri-na-abua na ise;

69. camel-ha di nnù na orú na iri na ise; inyinya-ibu-ha di nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-isi.

70. Ma ufọdu n'etiti ndi-isi ulo nke ndi bu nna nyere onyinye nke diri ije-ozi ahu. Tiashata tiyere n'ulo-àkù nnù daric ọla-edo abua na ọgu iri, na ọgu ọkwa-nwusa abua na iri, na nnù uwe ndi-nchu-àjà na ọgu isi na iri.

71. Ma ufọdu n'etiti ndi-isi ulo nke ndi bu nna tiyere n'ulo-àkù nke ije-ozi ahu orú nnù daric ọla-edo uzọ abua na nnù iri, na nnù pound ọla-ọcha ise na ọgu iri.

72. Ma nke ndi-ayi fọduru nyere di orú nnù daric ọla-edo uzọ abua na nnù iri, na nnù pound ọla ọcha ise, na ọgu uwe ndi-nchu-àjà atọ na asa.

73. Ndi-nchu-aja, na ndi Livai, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù, na ufọdu nime ndi Juda, na Netinim, na Israel nile, we biri n'obodo nile ha. Ọnwa nke-asa we rue, umu Israel nọ kwa n'obodo nile ha.