isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehemaia 11 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndi-isi ndi-Ju we biri na Jerusalem: ndi-Ju fọduru fe-kwa-ra nzà, ime ka otù onye nime madu iri bata ibi na Jerusalem, bú obodo nsọ, ka uzọ iteghete ndi fọduru biri kwa n'obodo ọzọ.

2. Ndi-Ju we gọzie ndikom ahu nile ndi were afọ-ofufo nye onwe-ha ibi na Jerusalem.

3. Ma ndia bu ndi-isi ala ahu anāchi achi ndi biri na Jerusalem: ma n'obodo nile nke Juda ka ndi ọzọ biri, nwoke ọ bula n'ihe-onwunwe-ya n'obodo nile ha, bú Israel, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Netinim, na umu ndi-orù Solomon.

4. Ma na Jerusalem ka ufọdu nime umu Juda na nime umu Benjamin biri. Site n'umu Juda: Ataia nwa Uzaia, nwa Zekaraia, nwa Amaraia, nwa Shefataia, nwa Mahalalel, site n'umu Perez;

5. na Maaseia nwa Beruk, nwa Kọl-hose, nwa Hazaia, nwa Adaia, nwa Joiarib, nwa Zekaraia, nwa onye Shailo.

6. Umu Perez nile ndi bi na Jerusalem di nnù na ọgu atọ na asatọ, ndikom bu dìnkpà.

7. Ndia bu kwa umu Benjamin: Salu nwa Meshulam, nwa Joed, nwa Pedaia, nwa Kolaia, nwa Maaseia, nwa Itiel, nwa Jeshaia.

8. N'iso ya Gabaia, na Salai, na nnù abua na ọgu isi na asatọ.

9. Joel nwa Zikri bu kwa onye nēlekọta ha: Juda nwa Hasenua bu kwa onye nke-abua n'ichi obodo ahu.

10. Site na ndi-nchu-àjà: Jedaia nwa Joiarib, na Jakin,

11. na Seraia nwa Hilkaia, nwa Meshulam, nwa Zedok, nwa Meraiot, nwa Ahaitub, bú onye-ndú ulo Chineke,

12. na umu-nne-ha ndi nēje ozi ulo ahu, nnù abua na orú na abua: na Adaia nwa Jeroham, nwa Pelalia, nwa Amzi, nwa Zekaraia, nwa Pashua, nwa Malkija,

13. na umu-nne-ya, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, ọgu iri-na-abua na abua: na Amashsai nwa Azarel, nwa Ahzai, nwa Meshilemot, nwa Imea,

14. na umu-nne-ha, bú ndi-dike bu dìnkpà, ọgu isi na asatọ: onye nēlekọta ha bu Zabdiel nwa Hagedolim.

15. Site kwa na ndi Livai: Shemaia nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaia, nwa Buni;

16. na Shabetai, na Jozabad, ndi sitere na ndi-isi ndi Livai, ndi bu ndi-isi nke ije-ozi nke èzí diri ulo Chineke;

17. na Matanaia nwa Maika, nwa Zabdi, nwa Esaf, onye bu isi nāmalite ikele ekele n'ekpere, na Bakbukia, bú onye nke-abua n'umu-nne-ya; na Abda nwa Shamua, nwa Galal, nwa Jedutun.

18. Ndi Livai nile n'obodo nsọ ahu di ọgu iri-na-anọ na anọ.

19. Ọzọ, ndi-ọnu-uzọ-ama, bú Akub, na Talmon, na umu-nne-ha, ndi nēche nche n'ọnu-uzọ-ama nile, di ọgu asatọ na iri na abua.

20. Ma ndi fọduru nke Israel, na nke ndi-nchu-àjà, na nke ndi Livai, nọ n'obodo nile nke Juda, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya.

21. Ma Netinim bi n'Ofel: Ziha na Gishpa bu kwa ndi-isi Netinim.

22. Ma onye-nlekọta ndi Livai nime Jerusalem bu Uzi nwa Bani, nwa Hashabaia, nwa Matanaia, nwa Maika, sitere n'umu Esaf, bú ndi-ọbù-abù, onye nēle ije-ozi nke ulo Chineke anya.

23. N'ihi na ihe eze nyere n'iwu di bayere ha, òkè kwesiri ntukwasi-obi di-kwa-ra ndi-ọbù-abù, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya.

24. Petahia nwa Meshezabel, onye sitere n'umu Zera nwa Juda, nọ kwa n'aka eze, ikwuru ndi-Ju okwu ọ bula.

25. Ma n'obodo ntà nle n'ọhia-ha, ufọdu nime umu Juda biri na Kiriat-aba na umu-obodo-ya, na nime Dibon na umu-obodo-ya, na nime Jekabzeel na obodo ntà ya;

26. na nime Jeshua, na nime Molada, na nime Bet-pelet;

27. na nime Haza-shual, na nime Bia-sheba na umu-obodo-ya;

28. na nime Ziklag, na nime Mekona, na n'umu-obodo-ya;

29. na n'En-rimon, na nime Zora, na nime Jamut;

30. na Zanoa, na Adulam, na obodo ntà ha, na Lekish na ọhia-ya nile, na Azeka na umu-obodo-ya. Ha we ma ulo-ikwū-ha site na Bia-sheba rue ndagwurugwu Hinom.

31. Umu Benjamin bi-kwa-ra site na Geba ga n'iru, nime Mikmash, na Aija, na Bet-el na umu-obodo-ya;

32. na Anatot, na Nob, na Anania;

33. na Hezoa, na Rema, na Gitaim;

34. na Hadid, na Zeboim, na Nebalat;

35. na Lod, na Ono, bú ndagwurugwu ndi-ọ̀kà.

36. Site kwa na ndi Livai òkè ufọdu nke Juda diri Benjamin.