isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehemaia 4 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e Sanbalat nuru na ayi onwe-ayi nālu mb͕idi, na iwe-ya di ọku, ewe kpasue ya iwe, o we chìa ndi-Ju ọchì.

2. O kwue okwu n'iru umu-nne-ya na usu-ndi-agha Sameria, si, Gini ka ndi-Ju ndia ndi nāta aru nēme? hà gārapuru onwe-ha ihe? hà gāchu àjà? hà gēme ka ọlu-ha gwusia n'otù ubọchi? hà gēsi n'obo ájá me ka nkume di adi ọzọ, ebe nkume ahu nile bu ihe akpọworo ọku?

3. Tobaia, bú onye Amon, nọ kwa n'akuku ya, ọ si, Ọzọ, mb͕idi nke ndi ahu nālu, ọ buru na nkita-ọhia arigo n'elu ya, o gētipú kwa mb͕idi-nkume-ha.

4. Nuru, Chineke-ayi; n'ihi na ayi bu ndi eledaworo anya: Gi me kwa ka ita-uta-ha laghachi n'isi-ha, Gi rara kwa ha nye ibu ihe-nluta-n'agha n'ala ndọta-n'agha:

5. ekpuchi-kwa-la ajọ omume-ha, ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie-ha n'iru Gi: n'ihi na ha akpasuwo Gi iwe n'iru ndi nālu mb͕idi.

6. Ayi we lua mb͕idi ahu; ewe lukọta mb͕idi nile rue nkera idi-elu-ya: n'ihi na ndi-Ju nwere obi ilu ọlu.

7. O rue na, mb͕e Sanbalat na Tobaia na ndi Arebia na ndi Amon na ndi Ashdod nuru na anāluzu mb͕idi Jerusalem nile, na amalitere ituchi ntipú-ya nile, iwe-ha we di ọku nke-uku;

8. ha we kekọta onwe-ha, ha nile n'otù, ibia ibuso Jerusalem agha, na ikpatara ya ihe-njehie.

9. Ayi we kpere Chineke-ayi, guzo ndi-nche megide ha ehihie na abali, n'ihi ha.

10. Juda we si, Ike nke ndi-ibu ebilatawo, ma nkpọnkpọ-ihe riri nne; ayi onwe-ayi apughi kwa ilu mb͕idi.

11. Ndi nākpab͕u ayi we si, Ha agaghi-ama, ha agaghi-ahu kwa, rue mb͕e ayi batara n'etiti ha, b͕ue ha, me ka ije-ozi ahu kwusi.

12. O rue, mb͕e ndi-Ju ndi bi n'akuku ha biara, na ha siri ayi ub͕ò iri site n'ebe ahu nile, Unu gēchigharikute ayi.

13. M'we guzo ndi-ayi n'ebe nile dikarisiri ala nke ebe di nime mb͕idi, n'ebe nile sara mbara, m'we guzo ndi-ayi dika ab͕uru nile ha si di, ha na mma-agha-ha, na ube-ha, na uta-ha.

14. M'we hu, bilie, si ndi amara aha-ha, si kwa ndi nọchiri anya eze, si kwa ndi-ayi fọduru, Unu atula egwu ha: chetanu Onye-nwe-ayi, Nke di uku di kwa egwu, bu-kwa-ranu umu-nne-unu, na umu-unu ndikom, na umu-unu ndinyom, na ndinyom-unu, na ulo-unu, agha.

15. O rue na, mb͕e ndi-iro-ayi nuru na ayi mara ya, na Chineke mebi-kwa-ra ndum-ọdu ha duritara onwe-ha, ayi nile we laghachi na mb͕idi, nwoke ọ bula ije ozi-ya.

16. O rue, site n'ubọchi ahu, na nkera ndi nējerem ozi nālu ọlu n'ije-ozi ahu, ma nkera nime ha nēji ube na ọta na uta na uwe-agha; ndi-isi nọ kwa n'azu ulo Juda nile.

17. Ndi nālu mb͕idi n'elu mb͕idi ahu na ndi nēbu ibu nēbo onwe-ha ibu, nwoke ọ bula nēwere otù aka-ya lu ọlu n'ije-ozi ahu, ma otù aka-ya nēji ihe-agha-ya;

18. ndi nālu mb͕idi kwa, nwoke ọ bula na mma-agha-ya ekeworo n'úkwù-ya nọ, ha we nālu mb͕idi otú a. Onye nāfù opì-ike nọ kwa n'akukum.

19. M'we si ndi amara aha-ha, si kwa ndi nọchiri anya eze, si kwa ndi-ayi fọduru, Ije-ozi a riri nne, sa kwa mbara, ayi onwe-ayi ekewawo n'elu mb͕idi, ayi we nọ n'ebe di anya, otù nwoke n'aru nwa-nne-ya.

20. N'ebe ọ bula unu nuru olu opì-ike, n'ebe ahu ka unu gāchikọta onwe-unu n'ebe ayi nọ; Chineke-ayi gēburu ayi agha.

21. Ayi onwe-ayi we nālu ọlu n'ije-ozi ahu: ma nkera-ha nēji ube site na chi-ọbubọ rue mb͕e kpakpando putara.

22. Ọzọ, na mb͕e ahu m'siri ndi-ayi, Ka nwoke ọ bula na onye nējere ya ozi nọ ọnọdu-abali n'etiti Jerusalem, ka ha we buru ayi ndi-nche n'abali, je kwa ozi n'ehihie.

23. Ma ọ dighi onye ọ bula, ma ọ bu mu onwem, ma-ọbu umu-nnem, ma-ọbu ndi nējerem ozi, ma-ọbu ndikom nche ndi nēsom, ọ dighi onye n'etiti ayi nēyipu uwe-ya, nwoke ọ bula were ihe-agha-ya je miri.