isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehemaia 10 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndi bu ndi-isi n'ikà ihe nile akara akàrà bu, Nehemaia, bú Tiashata, nwa Hakalaia, na Zedekaia;

2. na Seraia, na Azaraia, na Jeremaia;

3. na Pashua, na Amaraia, na Malkija;

4. na Hatush, na Shebania, na Maluk;

5. na Harim, na Meremot, na Obadaia;

6. na Daniel, na Gineton, na Beruk;

7. na Meshulam, na Abaija, na Mijamin;

8. na Maazia, na Bilgai, na Shemaia; ndia bu ndi-nchu-àjà.

9. Ndi Livai kwa: bú Jeshua nwa Azania, na Binui nke sitere n'umu Henadad, na Kadmiel;

10. na umu-nne-ha, bú Shebania, na Hodia, na Kelita, na Pelaia, na Hanan;

11. na Maika, na Rehob, na Hashabaia;

12. na Zakua, na Sherebia, na Shebania;

13. na Hodia, na Bani, na Beninu.

14. Ndi-isi ndi Israel: bú Parosh, na Pahat-moab, na Ilam, na Zatu, na Bani;

15. na Buni, na Azgad, na Bebai;

16. na Adonaija, na Bigvai, na Adin;

17. na Atea, na Hezekaia, na Azua;

18. na Hodia, na Hashum, na Bezai;

19. na Harif, na Anatot, na Nobai;

20. na Magpiash, na Meshulam, na Hezia;

21. na Meshezabel, na Zedok, na Jadua;

22. na Pelataia, na Hanan, na Anaia;

23. na Hoshea, na Hananaia, na Hashub;

24. na Halohesh, na Pilha, na Shobek;

25. na Rehum, na Hashabna, na Maaseia;

26. na Ahia, na Hanan, na Anan;

27. na Maluk, na Harim, na Beana.

28. Ndi-ayi fọduru, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù, na Netinim, na onye ọ bula nke siworo n'etiti ndi iche iche nke ala ọzọ kewapuru iwu Chineke onwe-ya, ha na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ha ndiyom, onye ọ bula nke mara ihe, nke nāghọta kwa ihe;

29. ha nēkekọta onwe-ha n'aru umu-nne-ha, bú ndi-ha di ebube, ha nābà kwa n'ọb͕ub͕a-iyi na n'ọṅuṅu-iyi, ijeghari n'iwu Chineke, nke enyere site n'aka Moses, bú orù Chineke, na idebe na ime ihe nile Jehova, bú Onye-nwe-ayi, nyere n'iwu, na ikpé-Ya nile na ukpuru-Ya nile;

30. ọzọ kwa, na ayi agaghi-enye ndi di iche iche nke ala ahu umu-ayi ndinyom, na ayi agaghi-aluta-kwa-ra umu-ayi ndikom umu-ha ndinyom:

31. ọzọ, ndi di iche iche nke ala ahu ndi nēwebata ihe-ahia na ọka ọ bula n'ubọchi-izu-ike ire ere, na ayi agaghi-azuru n'aka-ha n'ubọchi-izu-ike, ma-ọbu n'ubọchi nsọ: ọzọ, na ayi gārapu arọ nke-asa na ihe-nbinye ọ bula.

32. Ayi me-kwa-ra ihe enyere n'iwu ka ha guzoro ayi, bú ibokwasi onwe-ayi otù uzọ n'uzọ atọ nke otù shekel n'arọ iji fè òfùfè ulo Chineke-ayi;

33. bayere achicha anēdebe n'usoro, na onyinye-inata-iru-ọma anēnye mb͕e nile, baye-kwa-ra àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e nile, nke ubọchi-izu-ike nile, na nke ọnwa ọhu nile, bayere mb͕e nile akara àkà, baye-kwa-ra ihe nsọ nile, baye-kwa-ra àjà-nmehie nile ikpuchiri Israel nmehie, bú ije-ozi nile nke ulo Chineke-ayi.

34. Ayi fe-kwa-ra nzà, bú ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi-ayi nile, bayere onyinye iji biaru nso, bú nkú, iwebata ya n'ulo Chineke-ayi, dika ulo nna-ayi-hà si di, na mb͕e ezubere, kwa-arọ, isure n'elu ebe-ichu-àjà Jehova, bú Chineke-ayi, dika edeworo ya n'iwu:

35. na iwebata nkupuru mbu nke ala-ubi-ayi, na nkpuru mbu nke nkpuru nile nke osisi nile, kwa-arọ, n'ulo Jehova:

36. na umu eburu uzọ mu nke umu-ayi ndikom na nke anu-ulo-ayi, dika edeworo ya n'iwu, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-ayi na nke ìgwè ewu na aturu-ayi, iwebata ha n'ulo Chineke-ayi, nye ndi-nchu-àjà ndi nēje ozi n'ulo Chineke-ayi:

37. na ayi gēwebata-kwa-ra ndi-nchu-àjà utu ọka mbu ayi, na àjà-nbuli nile ayi, na nkpuru nke osisi nile ọ bula, na manya-vine ọhu, na manu, rue ime-ulo nke ulo Chineke-ayi; webata-kwa-ra ndi Livai otù uzọ n'uzọ iri nke ihe ala-ubi-ayi; n'ihi na ha onwe-ha, bú ndi Livai, nānara otù uzọ n'uzọ iri n'obodo nile nke ọlu-ubi-ayi.

38. Onye-nchu-àjà, bú nwa Eron, gānọye-kwa-ra ndi Livai, mb͕e ndi Livai nānara otù uzọ n'uzọ iri: ndi Livai gēwegota kwa otù uzọ n'uzọ iri nime otù uzọ n'uzọ iri nile rue ulo Chineke-ayi, rue ime-ulo, rue ulo àkù.

39. N'ihi na umu Israel na umu Livai gēwebata àjà-nbuli nke ọka na manya-vine ọhu na manu n'ime-ulo, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ihe nile nke ebe nsọ di, ha na ndi-nchu-àjà ndi nēje ozi, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù: ayi agaghi-arapu kwa ulo Chineke-ayi.