Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù-Ákwá 2:14-21 Bible Nso (IGBOB)

14. Ndi-amuma-gi ahutaworo gi ọhù ihe-efu na ihe-nzuzu;Ma ha ekpugheghi ajọ omume-gi, ime ka ndi-gi adọtara n'agha lata:Kama ha ahutaworo gi ibu di iche iche nke ihe-efu na ihe-nchupu di iche iche.

15. Ndi nile ndi nāgabiga n'uzọ akuwo aka megide gi;Ha amawo ọsọ̀ fufere ada Jerusalem isi, si:Ọ̀ bu nka bu obodo ahu nke anākpọ Ebe mazuru nma, Ihe-obi-utọ nke uwa nile?

16. Ndi-iro-gi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide gi;Ha amawo ọsọ̀, ta ikekere-ezé; ha asiwo, Ayi elodawo ya;N'ezie nka bu ubọchi ahu nke ayi lere anya ya; ayi achọtawo, ayi ahuwo.

17. Jehova emewo ihe nke O zubere;O mezuwo okwu-ọnu-Ya nke O nyere n'iwu site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie;Ọ kwadawo, ghara inwe ọmiko:O we me ka onye-iro ṅuria ọṅu n'aru gi,O mewo ka mpi nke ndi nākpab͕u gi di elu.

18. Obi-ha tikuru Onye-nwe-ayi nkpu:Gi mb͕idi ada Zaion, me ka anya-miri rùda dika osimiri ehihie na abali;Enyela onwe-gi izu-ike; ka nwa-anya-gi ghara ikwusi akwusi.

19. Bilie, tie nkpu n'abali, na nmalite nche di iche iche;Wusi obi-gi dika miri na ncherita-iru Onye-nwe-ayi:Chilie aka-gi n'ebe Ọ nọ n'ihi ndu umu-ntakiri-gi,Ndi nāda #mbà n'agu n'isi èsí nile.

20. Le, Jehova, legide onye I meworo otú a anya!Ndinyom, hà gēri nkpuru-ha, bú umu-ntakiri anātughari n'aka?Àgēb͕u onye-nchu-àjà na onye-amuma n'ebe nsọ nke Onye-nwe-ayi?

21. Nwa-okoro na agadi-nwoke edinawo ala n'èzí nile;Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam adawo site na mma-agha:I b͕uwo ha n'ubọchi iwe-Gi; I b͕usiwo, I nweghi ọmiko.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù-Ákwá 2