Ndi-iro-gi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide gi;Ha amawo ọsọ̀, ta ikekere-ezé; ha asiwo, Ayi elodawo ya;N'ezie nka bu ubọchi ahu nke ayi lere anya ya; ayi achọtawo, ayi ahuwo.