Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 21:12-24 Bible Nso (IGBOB)

12. Ha kpọsara obubu-ọnu, me ka Nebot nọdu n'isi ọnọdu n'etiti ndi Israel.

13. Ndikom abua ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we bata, nọdu n'iru ya: ndikom ahu ndi jọb͕uru onwe-ha we b͕a àmà megide ya, bú Nebot, n'iru ndi Israel, si, Nebot b͕akutere Chineke na eze azu. Ha we me ka ọ pua rue azu obodo, ha were nkume tub͕ue ya, o we nwua.

14. Ha we zigara Jezebel ozi, si, Atub͕uwo Nebot na nkume, ọ nwuwo kwa.

15. O rue, mb͕e Jezebel nuru na atub͕uwo Nebot na nkume, na ọ nwuwo kwa, na Jezebel siri Ehab, Bilie, nweta ubi-vine Nebot, bú onye Jezreel, nke ọ juru inye gi n'ego: n'ihi na Nebot adighi ndu, kama ọ nwuwo.

16. O rue, mb͕e Ehab nuru na Nebot anwuwo, na Ehab biliri iridaru ubi-vine Nebot, bú onye Jezreel, inweta ya.

17. Okwu Jehova we rue Elaija, bú onye Tisbe, nti, si,

18. Bilie, ridata izute Ehab, bú eze Israel, onye bi na Sameria; le, ọ nọ n'ubi-vine Nebot, ebe ọ ridara inweta ya.

19. Ma i gāgwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ì b͕uwo ọchu, nweta kwa? I gāgwa kwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N'ebe nkita rachara ọbara Nebot ka nkita gāracha ọbara-gi, ọbuná nke gi onwe-gi.

20. Ehab we si Elaija, Ì chọtawom, onye-irom? Ọ si, Achọtawom i: n'ihi na i rewo onwe-gi ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.

21. Le, M'nēme ka ihe ọjọ bakute gi, M'gēkpochapu ndi-gi fọduru, M'gēbipu kwa n'aru Ehab nwa-nwoke ọ bula, na onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n'Israel, ka Jehova kwuru:

22. M'gēme kwa ulo-gi ka ọ di ka ulo Jeroboam nwa Nebat, ka ọ di kwa ka ulo Beasha nwa Ahaija, n'ihi nkpasu-iwe nke i ji kpasum iwe, me kwa ka Israel mehie.

23. Ọzọ kwa, Jehova kwuru okwu bayere Jezebel, si, Nkita gēri Jezebel n'ékpè Jezreel.

24. Onye nke Ehab nke nwuru anwu n'obodo, nkita gēri ya; onye nke nwuru anwu n'ọhia, anu-ufe nke elu-igwe gēri kwa ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 21