isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 21 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Nebot, bú onye Jezreel, nwere ubi-vine, nke di na Jezreel, n'akuku ulo uku Ehab, bú eze Sameria.

2. Ehab we gwa Nebot okwu, si, Nyem ubi-vine-gi, ka o we burum ubi ab͕ara ogige ebe anāku akwukwọ nri, n'ihi na nke ahu di nso n'akuku ulom; ka m'nye kwa gi ubi-vine di nma kari ya n'ọnọdu ya: ma ọ buru na ọ di nma n'anya-gi, ka m'nye gi ego ruru ọnu-ahia-ya.

3. Nebot we si Ehab, Ya burum ihe-árú sitere na Jehova, bú inye gi ihe-nketa nnam-hà.

4. Ehab we ba n'ulo-ya n'obi arọ́ na nb͕aru-iru, n'ihi okwu nke Nebot, bú onye Jezreel, gwara ya: n'ihi na ọ siri, M'gaghi-enye gi ihe-nketa nnam-hà. O we dina n'ihe-ndina-ya, chigharia iru-ya, o righi kwa nri.

5. Jezebel, bú nwunye-ya, we biakute ya, gwa ya okwu, si, Gini me-kwa-ra mọ-gi di arọ́, i nērighi kwa nri?

6. Ọ si ya, N'ihi na agwaram Nebot, bú onye Jezreel, okwu, si ya, Nyem ubi-vine-gi n'ego; ma-ọbu, ọ buru na ọ tọ gi onwe-gi utọ, ka m'nye gi ubi-vine ọzọ n'ọnọdu ya: o we si, M'gaghi-enye gi ubi-vine nkem.

7. Jezebel, bú nwunye-ya, si ya, Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu eze nāchi Israel ub͕u a? bilie, rie nri, ka obi-gi di nma: mu onwem gēnye gi ubi-vine Nebot, bú onye Jezreel.

8. O we de akwukwọ n'aha Ehab, were nb͕a-aka-akàrà-ya ka ha, zigara ndi-okenye akwukwọ ahu, ziga-kwa-ra ndi amara aha-ha ndi nọ n'obodo-ya, ndi ha na Nebot bi.

9. O we de n'akwukwọ ahu, si, Kpọsanu obu-bu-ọnu, me ka Nebot nọdu n'isi ọnọdu n'etiti ndi Israel:

10. me-kwa-nu ka ndikom abua, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, nọdu n'iru ya, ka ha b͕a kwa àmà megide ya, si, I b͕akutere Chineke na eze azu. Me-kwa-nu ka ọ pua, werenu nkume tub͕ue ya, ka ọ nwua.

11. Ndikom obodo-ya, bú ndi-okenye na ndi amara aha-ha ndi bi n'obodo-ya, we me dika Jezebel zitere ha ozi, dika edere ya n'akwukwọ nke o zitere ha.

12. Ha kpọsara obubu-ọnu, me ka Nebot nọdu n'isi ọnọdu n'etiti ndi Israel.

13. Ndikom abua ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we bata, nọdu n'iru ya: ndikom ahu ndi jọb͕uru onwe-ha we b͕a àmà megide ya, bú Nebot, n'iru ndi Israel, si, Nebot b͕akutere Chineke na eze azu. Ha we me ka ọ pua rue azu obodo, ha were nkume tub͕ue ya, o we nwua.

14. Ha we zigara Jezebel ozi, si, Atub͕uwo Nebot na nkume, ọ nwuwo kwa.

15. O rue, mb͕e Jezebel nuru na atub͕uwo Nebot na nkume, na ọ nwuwo kwa, na Jezebel siri Ehab, Bilie, nweta ubi-vine Nebot, bú onye Jezreel, nke ọ juru inye gi n'ego: n'ihi na Nebot adighi ndu, kama ọ nwuwo.

16. O rue, mb͕e Ehab nuru na Nebot anwuwo, na Ehab biliri iridaru ubi-vine Nebot, bú onye Jezreel, inweta ya.

17. Okwu Jehova we rue Elaija, bú onye Tisbe, nti, si,

18. Bilie, ridata izute Ehab, bú eze Israel, onye bi na Sameria; le, ọ nọ n'ubi-vine Nebot, ebe ọ ridara inweta ya.

19. Ma i gāgwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ì b͕uwo ọchu, nweta kwa? I gāgwa kwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N'ebe nkita rachara ọbara Nebot ka nkita gāracha ọbara-gi, ọbuná nke gi onwe-gi.

20. Ehab we si Elaija, Ì chọtawom, onye-irom? Ọ si, Achọtawom i: n'ihi na i rewo onwe-gi ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.

21. Le, M'nēme ka ihe ọjọ bakute gi, M'gēkpochapu ndi-gi fọduru, M'gēbipu kwa n'aru Ehab nwa-nwoke ọ bula, na onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n'Israel, ka Jehova kwuru:

22. M'gēme kwa ulo-gi ka ọ di ka ulo Jeroboam nwa Nebat, ka ọ di kwa ka ulo Beasha nwa Ahaija, n'ihi nkpasu-iwe nke i ji kpasum iwe, me kwa ka Israel mehie.

23. Ọzọ kwa, Jehova kwuru okwu bayere Jezebel, si, Nkita gēri Jezebel n'ékpè Jezreel.

24. Onye nke Ehab nke nwuru anwu n'obodo, nkita gēri ya; onye nke nwuru anwu n'ọhia, anu-ufe nke elu-igwe gēri kwa ya.

25. (Otú ọ di, ọ dighi onye di ka Ehab, onye rere onwe-ya ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, onye Jezebel, bú nwunye-ya, rafuru.

26. Ọ we me ihe-árú nke-uku n'ijeso arusi di iche iche, dika ihe nile si di nke ndi-Amorait mere, ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.)

27. O rue, mb͕e Ehab nuru okwu ndia, na ọ dọwara uwe-ya nile, tukwasi ákwà-nkpe n'anu-aru-ya, bue ọnu, dina n'ákwà-nkpe, jegharia nwayọ.

28. Okwu Jehova we rue Elaija, bú onye Tisbe, nti, si,

29. Ì huwo na Ehab ewedawo onwe-ya n'ala n'irum? n'ihi na o wedawo onwe-ya n'ala n'irum, M'gaghi-eme ka ihe ọjọ ahu bia n'ubọchi-ya: ọ bu n'ubọchi nwa-ya ka M'gēme ka ihe ọjọ ahu biakwasi ulo-ya.