Ma i gāgwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ì b͕uwo ọchu, nweta kwa? I gāgwa kwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N'ebe nkita rachara ọbara Nebot ka nkita gāracha ọbara-gi, ọbuná nke gi onwe-gi.