M'gēme kwa ulo-gi ka ọ di ka ulo Jeroboam nwa Nebat, ka ọ di kwa ka ulo Beasha nwa Ahaija, n'ihi nkpasu-iwe nke i ji kpasum iwe, me kwa ka Israel mehie.