Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 19:25-31 Bible Nso (IGBOB)

25. ndi ọ kpọkọrọ, ha na ndi nālu ọlu di otú ahu, we si, Ndikom, unu mara na ayi nwere àkù-ayi site n'ọlu a.

26. Ma unu nāhu nānu kwa, na ọ bughi nání n'Efesọs kama ọ fọduru ihe ntà ka ọ buru n'Esia nile, ka Pọl nka rafuru oké ìgwè madu wepu kwa ha n'ezi uzọ, ebe ọ nāsi na ihe eji aka me abughi chi:

27. ọ bughi kwa nání na ihe-ize-ndu di na agēlelì ọlu-ayi nka; kama na agāgu kwa ulo nke oké chi-nwanyi ahu, bú Daiana, n'ihe-efu, na agaje kwa isi n'idi-uku-ya weda ya n'ala, onye Esia dum na elu-uwa dum madu bi nāsọpuru.

28. Mb͕e ha nuru nka, ha we juputa n'ọnuma, ti kwa nkpu, si, Daiana nke ndi Efesọs di uku.

29. Obodo ahu we juputa n'aghara ahu: ha we were otù obi nubà nime ebe anēkiri ihe, mb͕e ha jidesiri Gaiọs na Aristakọs, ndi Masedọnia, ndi nēso Pọl n'ije.

30. Ma mb͕e Pọl zubere ibakuru ọra madu ahu, ndi nēso uzọ Jisus ekweghi ya.

31. Ufọdu kwa n'etiti ndi-isi Esia, ebe ha bu ndi-eyì-ya, ha zigara ya ozi, we riọ ya ka ọ ghara inuye onwe-ya nime ebe ahu anēkiri ihe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 19