Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 19:13-30 Bible Nso (IGBOB)

13. Ma ufọdu nime ndi-Ju ndi nējeghari, bú ndi si na ha nāchupu ndi ajọ mọ, tiye-kwa-ra-aka-ha ikpọkwasi aha Onye-nwe-ayi Jisus n'isi ndi nwere ajọ mọ ahu, nāsi, Ewerem Jisus Onye Pọl nēkwusa b͕a unu iyi.

14. Umu-ndikom asa nke otù onye-Ju, anākpọ Skiva, bú onye-isi-nchu-àjà, di, ndi mere nka.

15. Ajọ mọ ahu we za, si ha, Jisus ka m'matara, ama-kwa-ram Pọl; ma ùnu onwe-unu bu ole ndi?

16. Nwoke ahu onye ajọ mọ di nime ya we wukwasi ha, karia ha abua, o nwe-kwa-ra ike n'aru-ha, ya mere ha si n'ulo ahu b͕apu, b͕ara ọtọ, emeru kwa ha aru.

17. Ewe me ka ndi nile ndi bi n'Efesọs, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, mara nka; ha nile we tua egwu, eme-kwa-ra aha Onye-nwe-ayi Jisus ka ọ di uku.

18. Ọtutu madu n'etiti ndi kwereri na Jisus bia-kwa-ra, nēkwuputa, nākọ kwa ihe nile ha nēme.

19. Ọ dighi kwa madu ole-na-ole n'etiti ndi nēme mb͕asi kpokọtara akwukwọ-ha, rechapu ha ọku n'iru ọra madu: ha we gua ọnu-ahia-ha, we hu na ọ bu ọgu nnù ego ọla-ọcha isi na nnù ise.

20. Otú a ka okwu Onye-nwe-ayi were ike nāga n'iru n'iru nādi kwa irè.

21. Ma mb͕e ihe ndia mezuru, Pọl zubere na mọ-ya iga Jerusalem, mb͕e ọ gāgabigasi nime Masedọnia na Akaia, si, Mb͕e m'rusiri ebe ahu, aghaghm ihu kwa Rom.

22. Mb͕e o zigasiri na Masedọnia madu abua nime ndi nējere ya ozi, bú Timọti na Erastọs, ya onwe-ya we nọdu n'Esia nwa oge.

23. Ma ihe di ka oge ahu ọ bughi nkpasu ntà putara bayere Uzọ Jisus.

24. N'ihi na otù nwoke, aha-ya bu Dimitriọs, bú uzú ọla-ọcha, onye nākpu ulo nsọ ntà nke ọla-ọcha nke Daiana, ọ bughi ọlu ntà ka onye ahu nēwetara ndi-ọ̀kà;

25. ndi ọ kpọkọrọ, ha na ndi nālu ọlu di otú ahu, we si, Ndikom, unu mara na ayi nwere àkù-ayi site n'ọlu a.

26. Ma unu nāhu nānu kwa, na ọ bughi nání n'Efesọs kama ọ fọduru ihe ntà ka ọ buru n'Esia nile, ka Pọl nka rafuru oké ìgwè madu wepu kwa ha n'ezi uzọ, ebe ọ nāsi na ihe eji aka me abughi chi:

27. ọ bughi kwa nání na ihe-ize-ndu di na agēlelì ọlu-ayi nka; kama na agāgu kwa ulo nke oké chi-nwanyi ahu, bú Daiana, n'ihe-efu, na agaje kwa isi n'idi-uku-ya weda ya n'ala, onye Esia dum na elu-uwa dum madu bi nāsọpuru.

28. Mb͕e ha nuru nka, ha we juputa n'ọnuma, ti kwa nkpu, si, Daiana nke ndi Efesọs di uku.

29. Obodo ahu we juputa n'aghara ahu: ha we were otù obi nubà nime ebe anēkiri ihe, mb͕e ha jidesiri Gaiọs na Aristakọs, ndi Masedọnia, ndi nēso Pọl n'ije.

30. Ma mb͕e Pọl zubere ibakuru ọra madu ahu, ndi nēso uzọ Jisus ekweghi ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 19