Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 23:10-30 Bible Nso (IGBOB)

10. Ka aghara kwa ikpọ unu ndi-ndú, n'ihi na otù Onye bu Onye-ndú-unu, Ya bu Kraist ahu.

11. Ma onye dikariri uku n'etiti unu gābu onye nējere unu ozi.

12. Ma onye ọ bula nke gēweli onwe-ya elu, agēweda ya; onye ọ bula nke gēweda kwa onwe-ya, agēweli ya elu.

13. Ma ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēmechi uzọ ala-eze elu-igwe n'iru madu: n'ihi na unu onwe-unu abataghi, unu adighi-ekwe kwa ndi nābata ka ha bata.

14. Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēripia ulo ndinyom di-ha nwuru, nēkpe kwa ogologo ekpere ka madu we hu unu: unu gēnwe ezi ọmuma-ikpe gabigara okè kari ndi ọzọ.

15. Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nējeghari n'oké osimiri na ala kpọrọ nku buruburu ka unu me otù onye ka o so uzọ-unu; ma mb͕e ọ ghọrọ otú ahu, unu nēme ya okpukpu abua nwa ọku ala-mọ kari onwe-unu.

16. Ahuhu gādiri unu, ndi-ndú ìsì, ndi si, Onye ọ bula nke gēji ulo nsọ Chineke ṅu iyí, ọ bughi ihe; ma onye ọ bula nke gēji ọla-edo nke ulo nsọ ahu ṅu iyí, o ji ugwọ.

17. Ndi-nzuzu na ndi-ìsì: n'ihi na òle nke dikariri uku, ọla-edo ahu, ma-ọbu ulo nsọ nke doro ọla-edo ahu nsọ?

18. Unu si kwa, Onye ọ bula nke gēji ebe-ichu-àjà ṅu iyí, ọ bughi ihe; ma onye ọ bula nke gēji ihe-onyinye di n'elu ya ṅu iyí, o ji ugwọ.

19. Ndi-ìsì: n'ihi na òle nke ka uku, ihe-onyinye, ma-ọbu ebe-ichu-àjà nke nēdo ihe-onyinye ahu nsọ?

20. Ya mere, onye ji ebe-ichu-àjà ahu ṅu iyí, o ji ya, na ihe nile di n'elu ya, ṅu iyí.

21. Onye ji kwa ulo nsọ ahu ṅu iyí, o ji ya, na Onye bi nime ya, ṅu iyí.

22. Onye ji kwa elu-igwe ṅu iyí, o ji oche-eze Chineke, na Onye nọduru n'elu ya, ṅu iyí.

23. Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēnye otù uzọ n'uzọ iri nke nkpa-akwukwọ nēsì ísì utọ na anise na cummin, unu arapuwo kwa ihe ka arọ́ n'iwu, bú ikpé, na ebere, na okwukwe: ma ọ di nkpà ka unu me ihe ndia, ka unu ghara kwa irapu ihe ahu.

24. Ndi-ndú ìsì, ndi nāzapu anwu ntà, ma unu nēloda camel.

25. Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēme ka azu iko na afere di ọcha, ma n'ime ha juputara site n'ipunara madu ihe na ejideghi-onwe-unu.

26. Gi Farisi kpuru ìsì, buru uzọ me ka ime iko na afere di ọcha, ka azu-ha we ghọ kwa ọcha.

27. Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu yiri ili eteworo nzu, nke nēgosi onwe-ha dika ihe ọma n'ìhè, ma n'ime ha juputara n'ọkpukpu nke ndi nwuru anwu, na adighi-ọcha nile.

28. Otú a unu onwe-unu nēgosi kwa onwe-unu nye madu n'ìhè dika ndi ezi omume, ma n'ime unu juputara n'iru-abua na ihe nēmebi iwu.

29. Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēwu ílì ndi-amuma, nēdozi kwa ebe anēlì ndi ezi omume,

30. unu nāsi kwa, Ọ buru na ayi nọri n'ubọchi nna-ayi-hà, ayi agaghi-eso ha n'inwekọ ọbara ndi-amuma.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 23