Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 29:23-34 Bible Nso (IGBOB)

23. na otù ob͕e achicha, na otù ob͕e achicha agwara manu, na otù mbadamba-achicha, site na nkata achicha ekoghi-eko ahu nke di n'iru Jehova:

24. i gātukwasi ha nile n'ọbu-aka abua nke Eron, na n'ọbu-aka nke umu-ya ndikom, fé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova.

25. I gānara kwa ha n'aka-ha, sure ha ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà n'elu àjà-nsure-ọku ahu, ka ha buru ihe ísì utọ n'iru Jehova: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu.

26. I gēsi kwa n'ebulu nke nmeju-aka nke diri Eron were okpukpu-obi-ya, fé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova: ọ gābu kwa òkè i nwere.

27. I gēdo kwa okpukpu-obi nke àjà-ofufé nsọ, ya na utaku-ukwu nke àjà-nbuli, nke anēfé, na nke anēbuli, site n'ebulu nke nmeju-aka ahu, bú site na nke diri Eron, site kwa na nke diri umu-ya ndikom:

28. ọ gābu kwa ihe Eron na umu-ya ndikom gēnwe dika ukpuru mb͕e ebighi-ebi sitere n'aka umu Israel: n'ihi na àjà-nbuli ka ọ bu: àjà-nbuli ka ọ gābu kwa sitere n'aka umu Israel, site n'ihe àjà nile nke àjà-udo-ha, bú àjà-nbuli-ha anēbuliri Jehova.

29. Uwe nsọ Eron nwere gādiri umu-ya ndikom ndi gānọchi ya, ka ewe te ha manu nime ha, meju kwa aka-ha nime ha.

30. Ubọchi asa ka o gēyiri ha, bú onye-nchu-àjà ahu nke gānọchi ya site n'umu-ya ndikom, mb͕e ọ nābà n'ulo-ikwū nzute ije ozi n'ebe nsọ ahu.

31. Ma ebulu nke nmeju-aka ahu, i gēwere ya sie anu-ya n'ebe di nsọ.

32. Eron na umu-ya ndikom gēri kwa anu ebulu ahu, na achicha nke di na nkata ahu, n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.

33. Ha gēri kwa ha, bú ihe eji kpuchi nmehie, imeju aka-ha na ido ha nsọ: ma onye ala ọzọ agaghi-eri ha, n'ihi na nsọ ka ha di.

34. Ma ọ buru na ihe afọdu site n'anu nke nmeju-aka ahu, ma-ọbu site n'achicha, rue ututu, i gēsure kwa ihe fọduru n'ọku: agaghi-eri ya, n'ihi na nsọ ka ọ di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 29