Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 15:12-23 Bible Nso (IGBOB)

12. I setiri aka-nri-Gi,Ala elo ha.

13. N'ebere-Gi ka I duworo ndi nke I b͕aputaworo:N'ike-Gi ka I duworo ha nwayọ rue ebe-obibi-Gi di nsọ.

14. Ndi ọzọ anuwo, ha ama jijiji:Ihe-nb͕u eb͕uwo ndi bi na Filistia.

15. Mb͕e ahu ka obi lọrọ ndi-isi Edom miri:Ebulu nke Moab, ọma-jijiji nējide ha:Ndi nile bi na Kenean ab͕azewo.

16. Oké ujọ na oké egwù nādakwasi ha;N'idi-uku nke ogwe-aka-Gi ha nọ jū dika nkume;Rue mb͕e ndi-Gi gāgabiga, Jehova,Rue mb͕e ndi nke I nwetara gāgabiga.

17. I gēme ka ha bata, I gāku kwa ha n'ugwu nke ihe-nketa-Gi,Bú ọnọdu guzosiri ike I meworo, ka ọ we buru ebe I gēbi, Jehova,Ebe di nsọ, Onye-nwe-ayi, nke aka-Gi abua meworo ka o guzosi ike.

18. Jehova gābu eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.

19. N'ihi na inyinya nile nke Fero, ha na ub͕ọ-ala-ya nile na ndi-inyinya-ya, bara nime oké osimiri, Jehova we me ka miri nke oké osimiri lata n'aru ha; ma umu Israel jere ije n'elu ala-akọrọ n'etiti oké osimiri.

20. Miriam, bú nwayi-amuma, bú nwa-nne-nwayi Eron, we were egwú-otiti n'aka-ya; ndinyom nile we chiri egwú-otiti na ite-egwú soro ya pua.

21. Miriam we za ha, si,Unu bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku;Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri.

22. Moses we me ka Israel si n'Oké Osimiri Uhie bulie ije, ha we pua ba n'ọzara Shua; ha we je ije ubọchi atọ n'ọzara ahu, ma ha achọtaghi miri.

23. Ha we biarue Mara, ma ha apughi iṅu miri nke Mara, n'ihi na ilu ka ha di: n'ihi nka akpọrọ aha-ya Mara.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 15