Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 3:21-29 Bible Nso (IGBOB)

21. Ihud we setipu aka-ekpe-ya, si n'apata-ukwu aka-nri ya were mma-agha ahu, ma ya n'afọ-ya:

22. isi-mma we soro kwa iru-mma ba; abuba we b͕ochipu iru-mma, na ọ dọputaghi mma-agha ahu n'afọ-ya; o we pua n'otule-ya.

23. Ihud we pua n'uzọ-nbata, mechibido ya ọnu-uzọ ime-ulo-elu ahu, kpachie ha.

24. Ma mb͕e ya onwe-ya pusiri, ndi-orù-ya batara; ha we hu, ma, le, akpachiwo ọnu-uzọ ime-ulo-elu ahu; ha si, Ọ bu nání na o nēkpuchi ukwu-ya abua n'ime-ulo ọjuju-oyi ya.

25. Ha we nēche rue mb͕e ihere mere ha: ma, le, o meghepughi ọnu-uzọ ime-ulo-elu ahu; ha we were nkpisi-ugodi, meghe ha: ma, le, onye-nwe-ha adawo n'ala nwua.

26. Ihud we wepuga onwe-ya mb͕e ọ nāb͕agwoju ha anya, ya onwe-ya we gabiga arusi ahu apiri api, wepuga onwe-ya rue Seira.

27. O rue, mb͕e ọ biara, na ọ fùru opì-ike n'ugwu Efraim, umu Israel we si n'ugwu ahu soro ya rida, ya onwe-ya we nọ n'iru ha.

28. Ọ si ha, B͕asonum n'azu: n'ihi na Jehova enyewo ndi-iro-unu, bú ndi Moab, n'aka-unu. Ha we soro ya rida, were ngabiga-miri Jọdan nile n'uzọ ije Moab, ha ekweghi kwa ka nwoke ọ bula gabiga.

29. Ha we tib͕ue Moab na mb͕e ahu, ihe ra ka orú nnù madu na nnù ise, nwoke ọ bula nke buru ibù, na nwoke ọ bula bu dìnkpà; ọ dighi kwa nwoke ọ bula wepugara onwe-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 3