Ọ si ha, B͕asonum n'azu: n'ihi na Jehova enyewo ndi-iro-unu, bú ndi Moab, n'aka-unu. Ha we soro ya rida, were ngabiga-miri Jọdan nile n'uzọ ije Moab, ha ekweghi kwa ka nwoke ọ bula gabiga.