Ma mb͕e ya onwe-ya pusiri, ndi-orù-ya batara; ha we hu, ma, le, akpachiwo ọnu-uzọ ime-ulo-elu ahu; ha si, Ọ bu nání na o nēkpuchi ukwu-ya abua n'ime-ulo ọjuju-oyi ya.