Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 20:18-24 Bible Nso (IGBOB)

18. Nwoke ọ bula nke ya na nwayi nke nāsọ uba nēdina, nke gēkpughe kwa ọtọ-ya; isi ọbara nwayi ahu ka ọ b͕abaworo ọtọ, nwayi ahu ekpughewo kwa isi ọbara nke ya onwe-ya: agēbipu kwa ha abua n'etiti ndi-ya.

19. Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwayi nke nne-gi, ma-ọbu ọtọ nke nwa-nne-nwayi nke nna-gi: n'ihi na onye-aru-ya ka ọ b͕abaworo ọtọ: ha gēbu ajọ omume-ha.

20. Nwoke ọ bula nke ya na nwunye nwa-nne nke nna-ya nēdina, ọtọ nwa-nne-nwoke nke nna-ya ka o kpugheworo: nmehie-ha ka ha gēbu; ha gāb͕a aka nwa nwua.

21. Nwoke ọ bula nke nēkuru nwunye nwa-nne-ya, ihe isọ nsọ ka ọ bu: ọtọ nwa-nne-ya nwoke ka o kpugheworo; ha gāb͕a aka nwa.

22. Unu gēdebe kwa ukpurum nile, na ikpém nile, me ha: ka ọ we ghara ibọputa unu, bú ala ahu nke Mu onwem nēme ka unu ba n'ebe ahu ibi nime ya.

23. Unu ejeghari-kwa-la n'ukpuru nile nke mba ahu, nke Mu onwem nāchupu n'iru unu: n'ihi na ihe ndia nile ka ha mere, ike ha we gwusiam.

24. Ma asim unu, Unu onwe-unu gēnweta ala-ha, Mu onwem gēnyekwara unu aka inweta ya, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke kpaworo ókè n'etiti unu na ndi nile ọzọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 20