Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 13:14-34 Bible Nso (IGBOB)

14. Ma n'ubọchi anāhu anu-aru ndu nime ya, ọ gāru árú.

15. Onye-nchu-àjà gāhu kwa anu-aru ndu ahu, si na ọ ruru árú: anu-aru ndu ahu, ihe ruru árú ka ọ bu: ekpenta ka ọ bu.

16. Ma-ọbu mb͕e anu-aru ndu ahu gātughari, b͕anwe ọcha, ọ gābiakute kwa onye-nchu-àjà,

17. onye-nchu-àjà gāhu ya: ma, le ọ buru na ihe-otiti ahu ab͕anwewo ọcha, onye-nchu-àjà gāsi na onye nwere ihe-otiti ahu di ọcha: ọcha ka ọ di.

18. Ọzọ, anu-aru, mb͕e ihe-ofifi di nime ya n'akpukpọ-aru-ya, ma eme ka ọ la.

19. ihe-otutó ọcha we di n'ọnọdu ihe otiti ahu, ma-ọbu ntupọ nēke uke, nke di ọcha nācha ọbara-ọbara, agēme ka onye-nchu-àjà hu ya;

20. onye-nchu-àjà gāhu kwa ya, ma, le, ọ buru na ọ di ala, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, aji-ya ab͕anwewo kwa ọcha, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ekpenta ka ọ bu, n'ihe-ofifi ahu ka ọ b͕awaputaworo.

21. Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú ya, ma, le, aji ọcha adighi nime ya, ọ dighi kwa ala kari akpukpọ-aru-ya, kama ihe ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi, onye-nchu-àjà gēmechibido ya nime ulo ubọchi asa;

22. ma ọ buru na ọ ba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ka ọ bu.

23. Ma ọ buru na ntupọ ahu nke nēke uke eguzo n'ọnọdu-ya, ma ọ baghi aba, apa ihe-ofifi ahu ka ọ bu; onye-nchu-àjà gāsi na ọ di ọcha.

24. Ma-ọbu anu-aru, mb͕e ọku-ọruru di n'akpukpọ-aru-ya, mb͕e anu-aru ndu nke ọku-ọruru ahu gāghọ ntupọ nēke uke, nke di ọcha nācha ọbara-ọbara, ma-ọbu ọcha;

25. onye-nchu-àjà gāhu ya: ma, le, ọ buru na aji ab͕anwewo ọcha nime ntupọ ahu nēke uke, ọ di kwa omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya; ekpenta ka ọ bu, n'ọku-ọruru ahu ka ọ b͕awaputaworo: onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ekpenta ka ọ bu.

26. Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú ya, ma, le, aji ọcha adighi nime ntupọ ahu nēke uke ọ dighi kwa ala kari akpukpọ-aru-ya, kama ihe ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi; onye-nchu-àjà gēmechibido kwa ya nime ulo ubọchi asa:

27. onye-nchu-àjà gāhu kwa ya n'ubọchi nke-asa: ọ buru na ọ ba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ekpenta ka ọ bu.

28. Ma ọ buru na ntupọ nke nēke uke eguzo n'ọnọdu-ya ma ọ baghi aba n'akpukpọ-aru-ya, kama ihe ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi; ihe-otutó nke ọku-ọruru ahu ka ọ bu, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ di ọcha: n'ihi na apa ọku-ọruru ahu ka ọ bu.

29. Ma nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ihe-otiti di n'aru-ya, n'isi ma-ọbu n'afu-ọnu,

30. onye-nchu-àjà gāhu ihe-otiti ahu: ma, le ọ, buru na ọ di omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na aji nācha edo edo, nke di irighiri, di nime ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ọria isi ka ọ bu, ekpenta nke isi ma-ọbu nke afu-ọnu ka ọ bu.

31. Ma mb͕e onye-nchu-àjà gāhu ihe-otiti nke ọria-isi ahu, ma, le, ọ dighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, aji oji adighi kwa nime ya, onye-nchu-àjà gēmechibido kwa onye nwere ihe-otiti ọria-isi ahu nime ulo ubọchi asa:

32. onye-nchu-àjà gāhu kwa ihe-otiti ahu n'ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ọria-isi ahu abaghi aba, ọ buru kwa na aji nke nācha edo edo adighi nime ya, ọ buru kwa na ọria-isi ahu adighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya,

33. agākọpu kwa isi-ya, ma, ọ gaghi-akọpu ọria-isi ahu: onye-nchu-àjà gēmechibido kwa onye nwere ọria-isi ahu ubọchi asa ọzọ:

34. onye-nchu-àjà gāhu kwa ọria-isi ahu n'ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ọria-isi abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na ọ dighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya; onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ di ọcha: ọ gāsu kwa uwe-ya nile, di ọcha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 13