isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 12 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndia bu eze ala ahu, ndi umu Israel tib͕uru, nweta ala-ha n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, site na ndagwurugwu Anon rue ugwu Heamon, na Araba nile n'akuku ọwuwa-anyanwu:

2. Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon, nāchi kwa site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na etiti ndagwurugwu ahu, na nkera Gilead, we rue miri-iyi Jabok, bú ókè-ala umu Amon;

3. na Araba ahu rue oké osimiri Kinerot, n'akuku ọwuwa-anyanwu, ru kwa oké osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú, n'akuku ọwuwa-anyanwu, n'uzọ ije Bet-jeshimot; na na Ndida, n'okpuru nkpọrube Pisga:

4. na ókè-ala Og, bú eze Beshan, onye sitere na ndi fọduru nke Refaim, onye bi n'Ashtarot na n'Edrei,

5. nāchi kwa n'ugwu Heamon, na nime Saleka, na nime Beshan nile, rue ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na nkera Gilead, bú ókè-ala Saihon, bú eze Heshbon.

6. Moses, bú orù Jehova, na umu Israel tib͕uru ha: Moses, bú orù Jehova, we nye ya ndi Reuben, nye kwa ndi Gad, nye kwa nkera ebo Manase, ka ọ buru ihe-nnweta.

7. Ndia bu kwa eze ala ahu ndi Joshua na umu Israel tib͕uru n'ofè Jọdan n'akuku Ọdida-anyanwu, site na Beal-gad nime ndagwurugwu Lebanon we rue ugwu Halak, nke nārigo rue Sia; Joshua we nye ya ebo Israel nile ka ọ buru ihe-nnweta dika esi kè ha n'òkè n'òkè;

8. n'ugwu, na n'ebe di ala ala, na n'Araba ahu, na nime nkpọrube nile, na n'ọzara, na nime Negeb; ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus:

9. eze Jeriko, otù; eze Ai, nke di n'akuku Bet-el, otù;

10. eze Jerusalem, otù; eze Hebron, otù:

11. eze Jamut, otù; eze Lekish, otù;

12. eze Eglon, otù; eze Gezea, otù;

13. eze Debia, otù; eze Geda, otù;

14. eze Họma, otù; eze Arad, otù;

15. eze Libna, otù; eze Adulam, otù;

16. eze Makeda, otù; eze Bet-el, otù;

17. eze Tapua, otù; eze Hefa, otù;

18. eze Efek, otù; eze Lasharon, otù;

19. eze Madon, otù; eze Hezoa, otù;

20. eze Shimron-meron, otù; eze Akshaf, otù;

21. eze Teanak, otù; eze Megido, otù;

22. eze Kedesh, otù; eze Jọkneam nime Kamel, otù;

23. eze Doa n'ebe di elu nke Doa, otù; eze Goim nime Gilgal, otù;

24. eze Tiaza, otù: eze ahu nile di orú na iri na otù.