isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 18 Bible Nso (IGBOB)

1. Nzukọ nile nke umu Israel we kpọkọta onwe-ha na Shailo, ma ulo-ikwū nzute n'ebe ahu: ewe buda ala ahu n'iru ha.

2. Ebo asa we fọdu n'etiti umu Israel, ndi anēkeghi ihe-nketa-ha.

3. Joshua we si umu Israel, Rùe ole mb͕e ka unu onwe-unu gābu ndi-ume-ngwu ibà inweta ala ahu, nke Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, nyeworo unu?

4. Doronu onwe-unu ndikom atọ inọrọ ebo ọ bula: m'gēziga kwa ha, ha gēbili kwa, jegharia n'ala nka, de ya n'akwukwọ dika ihe-nketa-ha si di; ha gābiakutekwam.

5. Ha gēkè kwa ya òkè asa: Juda gēguzo n'ókè-ala-ya na Ndida, ulo Josef gēguzo kwa n'ókè-ala-ha n'Ugwu.

6. Unu onwe-unu gēde kwa ala ahu n'akwukwọ n'òkè asa, wetaram akwukwọ ahu n'ebe a: m'gēfe-kwa-ra unu nzà n'ebe a n'iru Jehova, bú Chineke-ayi.

7. N'ihi na ndi Livai enweghi òkè n'etiti unu; n'ihi na ọlu-nchu-àjà Jehova bu ihe-nketa-ha: Gad na Reuben na nkera ebo Manase anarawo kwa ihe-nketa-ha n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, nke Moses, bú orù Jehova nyere ha.

8. Ndikom ahu we bilie, je: Joshua we nye ndi nēje ide ala ahu n'akwukwọ iwu, si, Jenu, jegharia n'ala nka, de ya n'akwukwọ, laghachikutem, m'gēfe-kwa-ra unu nzà n'ebe a n'iru Jehova, nime Shailo.

9. Ndikom ahu we je, gabiga n'ala ahu, de ya n'akwukwọ dika obodo nile si di n'òkè asa, ha we biakute Joshua rue ọmuma-ulo-ikwū nime Shailo.

10. Joshua we fere ha nzà nime Shailo n'iru Jehova: Joshua we kère umu Israel ala n'ebe ahu dika esi kè ha n'òkè n'òkè.

11. Ife-nzà nke ebo umu Benjamin we puta dika ab͕uru nile ha si di; ókè-ala nke ihe-ife-nzà-ha we puta n'etiti umu Juda na umu Josef.

12. Ókè-ala ha nwere n'akuku Ugwu we site na Jọdan; ókè-ala ahu we rigo rue akuku Jeriko n'Ugwu, rigo kwa n'ugwu n'akuku Ọdida-anyanwu; ọpupu-ya di kwa n'ọzara Bet-even.

13. Ókè-ala ahu we si n'ebe ahu gabiga rue Luz, rue akuku Luz (nke ahu bu Bet-el), n'akuku Ndida; ókè-ala ahu we rida rue Atarot-ada, n'elu ugwu nke di na Ndida nke Bet-horon di n'okpuru.

14. Ewe kpa ókè ahu, o we b͕a buruburu rue akuku Ọdida-anyanwu n'akuku Ndida, site n'ugwu nke di n'iru Bet-horon n'akuku Ndida; ọpupu-ya di kwa na Kiriat-beal (nke ahu bu Kiriat-jearim), bú obodo umu Juda: nka bu akuku Ọdida-anyanwu.

15. Akuku Ndida we site na nsọtu Kiriat-jearim, ókè-ala ahu we pua n'akuku Ọdida-anyanwu, pua rue isi-iyi miri Neftoa:

16. ókè-ala ahu we rida rue nsọtu ugwu ahu nke di n'iru ndagwurugwu nwa Hinom, nke di na ndagwurugwu Refaim n'akuku Ugwu; ọ rida rue ndagwurugwu Hinom, rue akuku ndi Jebus n'akuku Ndida, we rida rue En-rogel;

17. ewe kpa ókè-ala ahu n'Ugwu, ọ pua n'En-shemesh, pu kwa rue Gelilot, nke di na ncherita-iru nrigo Adumim; ọ rida rue nkume Bohan nwa Reuben;

18. ọ gabiga rue akuku na ncherita-iru Araba n'akuku Ugwu, we rida rue Araba:

19. ókè-ala ahu we gabiga rue akuku Bet-họgla n'akuku Ugwu: ọpupu ókè-ala ahu di kwa n'ọnu-miri Ugwu nke Oké Osimiri Nnú, na nsọtu Ndida nke Jọdan; nka bu ókè-ala Ndida.

20. Jọdan bu kwa ókè-ala-ya n'akuku Iru-anyanwu. Nka bu ihe-nketa umu Benjamin, dika ókè-ala-ya nile si di buruburu dika ab͕uru nile ha si di.

21. Ma obodo ebo umu Benjamin nwere dika ab͕uru nile ha si di bu Jeriko, na Bet-họgla, na Emek-keziz;

22. na Bet-araba, na Zemaraim, na Bet-el;

23. na Avim, na Para, na Ọfra;

24. na Kefa-amoni, na Ọfni, na Geba; obodo iri na abua na obodo ntà ha:

25. na Gibeon, na Rema, na Beirot;

26. na Mizpeh, na Kefira, na Moza;

27. na Rekem, na Iapeel, na Tarala;

28. na Zela, na Elef, na ndi Jebus (nke ahu bu Jerusalem), na Gibeat, na Kiriat; obodo iri na anọ na obodo ntà ha. Nka bu ihe-nketa umu Benjamin dika ab͕uru nile ha si di.