isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 14 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndi bu ihe nke umu Israel ketara n'ala Kenean, ndi Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ebo nile nke umu Israel, mere ka ha keta;

2. n'ifè-nzà ka ihe-nketa-ha di, dika Jehova nyere iwu n'aka Moses, bayere ebo iteghete ahu, baye-kwa-ra nkera ebo ahu.

3. N'ihi na Moses nyere ihe-nketa nke ebo abua na nkera ebo ahu n'ofè Jọdan: ma o nyeghi ndi Livai ihe-nketa n'etiti ha.

4. N'ihi na umu Josef bu ebo abua, bú Manase na Efraim: ha enyeghi kwa ndi Livai òkè n'ala ahu, ma-ọbughi obodo ufọdu ibi obi, ha na ebe-ita-nri-ha nke diri anu-ulo-ha na àkù ha kpatara.

5. Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka umu Israel mere, ha we kè ala ahu.

6. Umu Juda we biarue nso Joshua nime Gilgal: Keleb nwa Jefune, bú onye-Kenizait, we si ya, Gi onwe-gi amawo okwu Jehova gwara Moses, bú onye nke Chineke, bayerem, baye-kwa-ra gi, nime Kedesh-banea.

7. Ọgu arọ abua ka m'b͕ara mb͕e Moses, bú orù Jehova, si na Kedesh-banea zipum iledo ala nka; m'we weghachiri ya okwu dika o si di n'obim.

8. Ma umu-nnem ndi mu na ha rigoro mereka obi lọ ndi Israel miri: ma mu onwem sozuru Jehova, bú Chinekem, n'azu.

9. Moses we ṅua iyi n'ubọchi ahu, si, Ala nke i zọkwasiri ukwu aghaghi iburu gi na umu-gi ihe-nketa rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na i sozuwo Jehova, bú Chinekem, n'azu.

10. Ma ub͕u a, le, Jehova emewo ka m'di ndu, dika O kwuru, ọgu arọ abua na ise ndia, site na mb͕e Jehova gwara Moses okwu a, mb͕e Israel jere ije n'ọzara: ma ub͕u a, le, mu onwem b͕ara ọgu arọ anọ na ise ta.

11. Rue ub͕u a m'di ike ta dika m'di n'ubọchi Moses zigaram: dika ikem si di mb͕e ahu, otú a ka ikem di kwa ub͕u a, ibu agha, na ipu apu, na ibata abata.

12. Ma ub͕u a, nyem ugwu a, nke Jehova kwuru okwu bayere ya n'ubọchi ahu; n'ihi na i nuru n'ubọchi ahu na ndi Anak nọ n'ebe ahu, na obodo di uku nke ewusiri ike: eleghi anya Jehova gānọyerem, m'gānapu kwa ha ala-ha, dika Jehova kwuru.

13. Joshua we gọzie ya; ọ we nye Keleb nwa Jefune Hebron ibu ihe-nketa.

14. N'ihi nka Hebron we ghọrọ Keleb nwa Jefune, bú onye-Kenizait, ihe-nketa, rue ta; n'ihi na o sozuru Jehova, bú Chineke Israel, n'azu.

15. Ma aha Hebron na mb͕e gara aga bu Kiriat-aba; onye dikarisiri uku n'etiti ndi Anak ka Aba ahu bu. Ala ahụ we rapu ibu agha, di jū.