isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 15 Bible Nso (IGBOB)

1. Ife-nzà nke mara ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di we dirue ókè-ala Edom, rue ọzara Zin n'akuku Ndida, na nsọtu Ndida.

2. Ókè-ala Ndida nke ha nwere we di site na nsọtu Oké Osimiri Nnú, site n'ọnu-miri nke nēche iru na Ndida:

3. o we pua rue akuku Ndida nke nrigo Akrabim, gabiga rue Zin, rigo n'akuku Ndida nke Kedesh-banea, gabiga Hezron, rigorue Ada, b͕a buruburu rue Kaka:

4. o we gabiga rue Azmon, pua na miri-iyi Ijipt; ọpupu ókè-ala ahu we di n'oké osimiri: nka gāburu unu ókè-ala Ndida.

5. Ókè-ala ọwuwa-anyanwu we buru Oké Osimiri Nnú, rue nsọtu Jọdan. Ókè-ala akuku Ugwu we site n'ọnu-miri nke oké osimiri ahu na nsọtu Jọdan:

6. ókè-ala ahu we rigo rue Bet-họgla, gabiga n'akuku Ugwu nke Bet-araba; ókè-ala ahu we rigo rue nkume Bohan nwa Reuben:

7. ókè-ala ahu we rigo rue Debia site na ndagwurugwu Ekoa, ga n'akuku Ugwu, nēche Gilgal iru, nke di na ncherita-iru nrigo Adumim, nke di n'akuku Ndida nke miri-iyi ahu: ókè-ala ahu we gabiga rue miri En-shemesh, ọpupu-ya we dirue En-rogel:

8. ókè-ala ahu we rigo na ndagwurugwu nwa Hinom rue akuku ndi Jebus n'akuku Ndida (ndida ahu bu Jerusalem): ókè-ala ahu we rigo rue elu ugwu ahu nke di n'iru ndagwurugwu Hinom n'akuku Ọdida-anyanwu, nke di na nsọtu ndagwurugwu Refaim n'akuku Ugwu:

9. ewe kpa ókè-ala ahu site n'elu ugwu rue isi-iyi miri Neftoa, ọ we pua rue obodo nile nke ugwu Efron; ewe kpa ókè-ala ahu rue Beala (nke ahu bu Kiriat-jearim):

10. ókè-ala ahu we b͕a buruburu site na Beala ga n'akuku Ọdida-anyanwu, rue ugwu Sia, we gabiga rue akuku ugwu Jearim n'Ugwu (nke ahu bu Kesalon), rida rue Bet-shemesh, gabiga Timna:

11. ókè-ala ahu we pua rue akuku Ekron n'akuku Ugwu: ewe kpa ókè-ala ahu rue Shikeron, o we gabiga rue ugwu Beala, we pua na Jabneel; ọpupu ókè-ala ahu di n'oké osimiri.

12. Ókè-ala Ọdida-anyanwu we di rue oké osimiri uku ahu, na ókè-ala-ya. Nka bu ókè-ala umu Juda buruburu, dika ab͕uru nile ha si di.

13. Ọ nye-kwa-ra Keleb Jefune òkè n'etiti umu Juda, dika okwu-ọnu Jehova gwara Joshua si di, bú Kiriat-aba; Aba bu nna Anak (nke ahu bu Hebron).

14. Keleb we si n'ebe ahu napu umu-ndikom Anak atọ, bú Sheshai, na Ahiman, na Talmai, umu Anak, ala-ha.

15. Ọ we si n'ebe ahu rigo imegide ndi bi na Debia: ma aha Debia na mb͕e gara aga bu Kiriat-sefa.

16. Keleb we si, Onye ahu nke gētib͕u Kiriat-sefa, were ya, m'gēnye kwa ya Aksa, bú nwam nwayi, na nwunye.

17. Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne Keleb, we were ya: o we nye ya Aksa, bú nwa-ya nwayi, na nwunye.

18. O rue, mb͕e Aksa biara, na ọ kpaliri di-ya iriọ ubi n'aka nna-ya: Aksa si n'inyinya-ibu-ya rida; Keleb we si ya, Gini ka i nāchọ?

19. Ọ si, Nyem ngọzi; n'ihi na ọ bu ala Negeb ka i nyeworom, nyekwam isi miri ufọdu. Ọ we nye ya isi miri di n'elu, na isi miri di n'okpuru.

20. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di.

21. Obodo nke di na nsọtu ebo umu Juda nwere n'akuku ókè-ala Edom nime Negeb bu Kabzeel, na Ida, na Jagua;

22. na Kina, na Dimona, na Adada;

23. na Kedesh, na Hezoa, na Itnan;

24. na Zif, na Telem, na Bealot;

25. na Hezoa-hadata, na Keriot-hezron (nke ahu bu Hezoa);

26. na Amam, na Shema, na Molada;

27. na Haza-gada, na Heshmon, na Bet-pelet;

28. na Haza-shual, na Bia-sheba, na Biziotia;

29. na Beala, na Iyim, na Ezem;

30. na Eltolad, na Kesil, na Họma;

31. na Ziklag, na Madmana, na Sansana;

32. na Lebaot, na Shilhim, na Ain, na Rimon: obodo nile di orú na iteghete, ha na obodo ntà ha.

33. N'ebe di ala ala, Eshtaol, na Zọra, na Ashna;

34. na Zanoa, na En-ganim, na Tapua, na Inam;

35. na Jamut, na Adulam, na Soko, na Azeba;

36. na Shaaraim, na Aditaim, na Gedira, na Gedirotaim; obodo iri na anọ na obodo ntà ha.

37. Zenan, na Hadasha, na Migdal-gad;

38. na Dilan, na Mizpe, na Jọkteel;

39. na Lekish, na Bọzkat, na Eglon;

40. na Kabon, na Lahmam, na Kitlish;

41. na Gedirot, na Bet-degon, na Neama, na Makeda; obodo iri na isi na obodo ntà ha.

42. Libna, na Eta, na Ashan;

43. na Ifta, na Ashna, na Nezib;

44. na Keila, na Akzib, na Marisha; obodo iteghete na obodo ntà ha.

45. Ekron, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile:

46. site n'Ekron we rue oké osimiri, obodo nile nke di n'akuku Ashdod, na obodo ntà ha.

47. Ashdod, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile; Geza, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile; rue miri-iyi Ijipt, na oké osimiri uku ahu, na ókè-ala-ya.

48. N'ugwu kwa, Shamia, na Jatia, na Soko;

49. na Dana, na Kiriat-sana (nke ahu bu Debia);

50. na Anab, na Eshtemo, na Anim;

51. na Goshen, na Holon, na Gailo; obodo iri na otù na obodo ntà ha.

52. Arab, na Duma, na Eshan;

53. na Janim, na Bet-tapua, na Afika;

54. na Humta, na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), na Zioa; obodo iteghete na obodo ntà ha.

55. Maon, na Kamel, na Zif, na Juta;

56. na Jesreel; na Jokdeam, na Zanoa;

57. na Kain, na Gibea, na Timna; obodo iri na obodo ntà ha.

58. Halhul, na Bet-zua, na Gedoa;

59. na Maarat, na Bet-anot, na Eltekon; obodo isi na obdo ntà ha.

60. Kiriat-beal (nke ahu bu Kiriat-jearim), na Raba; obodo abua na obodo ntà ha.

61. N'ọzara, Bet-araba, na Midin, na Sekaka;

62. na Nibshan, na Obodo Nnú, na En-gedi; obodo isi na obodo ntà ha.

63. Ma ndi Jebus, ndi bi na Jerusalem, umu Juda apughi inapu ha ala-ha: ndi Jebus we biri n'etiti umu Juda nime Jerusalem, rue ta.