isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 16 Bible Nso (IGBOB)

1. Ife-nzà nke mara umu Josef siri na Jọdan pua Jeriko, na miri Jeriko n'ọwuwa-anyanwu, bú ọzara ahu, nēsi na Jeriko rigo n'ugwu rue Bet-el;

2. o si na Bet-el pua rue Luz, gabiga rue ókè-ala ndi-Akait rue Atarot;

3. ọ rida n'akuku Ọdida-anyanwu rue ókè-ala ndi-Jafletait, rue ókè-ala Bet-horon di n'okpuru, rue Gezea: ọpupu-ya we di n'oké osimiri.

4. Umu Josef, bú Manase na Efraim, we keta nke ha.

5. Ókè-ala umu Efraim, dika ab͕uru nile ha si di, we di otú a: ókè-ala nke ihe-nketa-ha n'akuku ọwuwa-anyanwu bu Atarot-ada, rue Bet-horon di n'elu;

6. ókè-ala ahu we pua n'akuku Ọdida-anyanwu na Mikmetat n'Ugwu; ókè-ala ahu we b͕a buruburu n'akuku ọwuwa-anyanwu, rue Taanat-shailo, we gabiga ya n'akuku ọwuwa-anyanwu Janoa;

7. o si na Janoa rida rue Atarot, ru kwa Naarah, metu Jeriko, we pua na Jọdan.

8. Ókè-ala ahu siri na Tapua je n'akuku Ọdida-anyanwu rue miri-iyi Kena; ọpupu-ya we di n'oké osimiri. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Efraim dika ab͕uru nile ha si di;

9. tiyere obodo nile akpaputara umu Efraim n'etiti ihe-nketa nke umu Manase, obodo ahu nile na obodo ntà nile ha.

10. Ma ha anapughi ndi Kenean ndi bi na Gezea ala-ha: ndi Kenean we biri n'etiti Efraim, rue ta, ghọ ndi nēfè òfùfè orù.