Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 10:7-20 Bible Nso (IGBOB)

7. Joshua we si na Gilgal rigo, ya onwe-ya, na ndi-agha nile tiyere ya, na ndi-dike nile, bú ndi-dìnkpà.

8. Jehova we si Joshua, Atula egwu ha: n'ihi na n'aka-gi ka M'nyeworo ha; ọ dighi nwoke nime ha nke gēguzo n'iru gi.

9. Joshua we biakwasi ha na mberede; n'ihi na ogologo abali nile ka o si na Gilagal rigo.

10. Jehova we chusa ha n'iru Israel, o tib͕ue ha oké ntib͕u na Gibeon, we chusa ha n'uzọ nrigo Bet-horon, tib͕ue ha rue Azeka, ru kwa Makeda.

11. O rue, mb͕e ha si n'iru Israel b͕alaga, mb͕e ha nọ na nrida Bet-horon, na Jehova si n'elu-igwe tudakwasi ha nkume uku rue Azeka, ha we nwua: ndi nwuru na nkume ákú-miri-ígwé ahu kariri ndi umu Israel were mma-agha b͕ue.

12. Mb͕e ahu Joshua gwara Jehova okwu n'ubọchi Jehova rara ndi-Amorait nye n'iru umu Israel; o we si n'anya Israel,Anyanwu, guzo du n'elu Gibeon;Gi Ọnwa kwa, na ndagwurugwu Ajalon.

13. Anyanwu we guzo du, ọnwa guzo-kwa-ra,Rue mb͕e mba ahu bọsiri ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro-ha.Èdeghi nka n'akwukwọ Jasha? Anyanwu we guzo n'etiti elu-igwe, o meghi kwa ngwa ida ihe ra ka otù ubọchi zuru ezu.

14. Ọ dighi kwa ubọchi di ka ubọchi ahu n'iru ya ma-ọbu n'azu ya, na Jehova gere nti olu madu: n'ihi na Jehova nēburu Israel agha.

15. Joshua we lata, ya na Israel nile, rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal.

16. Eze ise ndia we b͕alaga, zo onwe-ha n'ọb͕à na Makeda.

17. Ewe gosi Joshua, si, Achọtawo eze ise ahu, ha ezowo onwe-ha n'ọb͕à na Makeda.

18. Joshua we si, Kpọrenu nkume uku rue ọnu ọb͕à ahu, do kwa ndikom n'elu ya dika ndi-nlekọta idebe ha:

19. ma unu onwe-unu eguzola; nāchunu ndi-iro-unu n'azu, tib͕u kwa ndi-ikpe-azu n'etiti ha; unu ekwela ka ha ba n'obodo di iche iche ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, enyewo ha n'aka-unu.

20. O rue, mb͕e Joshua na umu Israel tib͕usiri ha oké ntib͕u nke-uku, rue mb͕e emere ka ha gwusia, mb͕e ndi fọduru, bú ndi fọduru n'etiti ha, basi-kwa-ra n'obodo ewusiri ike,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 10