ma unu onwe-unu eguzola; nāchunu ndi-iro-unu n'azu, tib͕u kwa ndi-ikpe-azu n'etiti ha; unu ekwela ka ha ba n'obodo di iche iche ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, enyewo ha n'aka-unu.