Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezra 3:8-13 Bible Nso (IGBOB)

8. Ma n'arọ nke-abua nke ọbibia-ha nke ha biaruru ulo Chineke nime Jerusalem, n'ọnwa nke-abua, ha malitere, bú Zerubabel nwa Shealitiel, na Jeshua nwa Jozadak, na ndi fọduru n'umu-nne-ha, bú ndi-nchu-àjà na ndi Livai, na ndi nile ndi nēsi na ndọta-n'agha ahu bia na Jerusalem; ha we guzo ndi Livai, site n'onye b͕ara orú arọ ga n'iru, ibu ndi-isi n'ije-ozi nke ulo Jehova.

9. Jeshua we guzo, ya na umu-ya ndikom na umu-nne-ya, na Kadmiel na umu-ya ndikom, bú umu Juda, dika otù onye, ibu ndi-isi nke ndi nēje ozi ahu n'ulo Chineke: umu-ndikom Henadad na umu-ha ndikom ṅa umu-nne-ha, bú ndi Livai.

10. Ma mb͕e ndi nēwu ulo tọrọ ntọ-ala ulo no, uku Jehova, ha we guzo ndi-nchu-àjà n'uwe-ha chiri opì, na ndi Livai, bú umu Esaf, chiri ájà, ito Jehova, dika ukpuru Devid, bú eze Israel, si di.

11. Ha we zarita onwe-ha n'ito na n'ikele Jehova, si, N'ihi na Ọ di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di n'ebe Israel nọ. Ndi Israel nile we tie oké nkpu, mb͕e ha toro Jehova, n'ihi na atọrọ ntọ-ala ulo Jehova.

12. Ma ọtutu nime ndi-nchu-àjà na ndi Livai na ndi-isi ulo nke ndi bu nna, bú ndi-okenye ndi huru ulo mbu, mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo a n'anya-ha, ha nākwa ákwá n'oké olu; ọtutu nọ kwa n'iti nkpu n'ọṅù, nēweli olu-ha:

13. ndi Israel amataghi kwa ihe bu olu iti-nkpu ọṅù na nke bu olu ikwa-ákwá ndi Israel: n'ihi na ndi Israel nēti oké nkpu, ewe nu olu-ya rue ebe di anya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezra 3