Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezra 3:10-13 Bible Nso (IGBOB)

10. Ma mb͕e ndi nēwu ulo tọrọ ntọ-ala ulo no, uku Jehova, ha we guzo ndi-nchu-àjà n'uwe-ha chiri opì, na ndi Livai, bú umu Esaf, chiri ájà, ito Jehova, dika ukpuru Devid, bú eze Israel, si di.

11. Ha we zarita onwe-ha n'ito na n'ikele Jehova, si, N'ihi na Ọ di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di n'ebe Israel nọ. Ndi Israel nile we tie oké nkpu, mb͕e ha toro Jehova, n'ihi na atọrọ ntọ-ala ulo Jehova.

12. Ma ọtutu nime ndi-nchu-àjà na ndi Livai na ndi-isi ulo nke ndi bu nna, bú ndi-okenye ndi huru ulo mbu, mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo a n'anya-ha, ha nākwa ákwá n'oké olu; ọtutu nọ kwa n'iti nkpu n'ọṅù, nēweli olu-ha:

13. ndi Israel amataghi kwa ihe bu olu iti-nkpu ọṅù na nke bu olu ikwa-ákwá ndi Israel: n'ihi na ndi Israel nēti oké nkpu, ewe nu olu-ya rue ebe di anya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezra 3