Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 33:1-15 Bible Nso (IGBOB)

1. Nka bu kwa ngọzi ahu, nke Moses, bú onye nke Chineke, gọziri umu Israel tutu ọnwu-ya.

2. Ọ we si,Jehova siri na Sainai bia,Si kwa na Sia walitere ha;O siri n'ugwu Peran nwuputa,O si-kwa-ra na ndi nsọ anāpughi iguta ọnu bia:Ọku di n'aka-nri-Ya, bú iwu enyere ha.

3. E, Ọ nāhu ndi nke Ya nile n'anya;Ndi nsọ Ya nile di n'aka-gi:Ndi ahu we nọdu ala n'ukwu-gi;Onye ọ bula gānata ufọdu nime okwu-gi.

4. Iwu ka Moses nyere ayi,Bú ihe-nnweta nke nkpọkọta Jekob.

5. Ọ we buru eze nime Jeshurun,Mb͕e ndi-isi ndi Israel chikọtara onwe ha,Ebo nile nke Israel n'otù.

6. Ka Reuben di ndu, ghara kwa inwu;Ma ka ndikom-ya di ole-na-ole.

7. Nka bu kwa ngọzi nke Juda: ọ we si,Jehova, nu olu Juda,Me kwa ka ọ bakute ndi-ya:Aka-ya abua aluworo ya onwe-ya ọ̀gù;Onye-iye-aka megide ndi nākpab͕u ya ka I gābu.

8. Ọ we kwue ihe bayere Livai, si,Izu-okè-Gi na Ìhè-Gi diri onye-ebere-Gi,Onye I nwara na Masa,Onye Gi na ya nēse okwu n'akuku miri Meriba;

9. Onye ahu nke nēkwu okwu bayere nna-ya, baye-kwa-ra nne-ya, si, Ahughm ya;Umu-nne-ya ka ọ nāmataghi kwa;Umu-ya ka ọ nāmaghi kwa;N'ihi na ha edebewo okwu-ọnu-Gi,Ọb͕ub͕a-ndu-Gi ka ha nēchezi kwa.

10. Ha gēzí Jekob ikpé-Gi nile,Iwu-Gi ka ha gēzí kwa Israel:Ha gētiye ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'imi-Gi,Tiye kwa àjà-nsuresi-ọku n'elu ebe-ichu-àjà-Gi.

11. Jehova, gọzie àkù-ya,Ka ọlu aka-ya abua tọ kwa Gi utọ:Mapue úkwù ndi nēbili imegide ya,Na nke ndi nākpọ ya asì, ka ha ghara ibili ọzọ.

12. O kwuru ihe bayere Benjamin, si,Onye Jehova huru n'anya gēbi na ntukwasi-obi n'akuku Ya;O nēkpuchi ya ogologo ubọchi nile,Ọ bu kwa n'etiti ubu-Ya abua ka o nēbi.

13. Ọ we kwue ihe bayere Josef, si,Ihe Jehova nāgọzi ka ala-ya bu;Site n'ihe di oké ọnu-ahia nke elu-igwe, site n'igirigi,Site kwa n'ob͕u-miri nke nāmakpu n'okpuru.

14. Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-ọmume anyanwu,Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-npuputa nke ọnwa nile.

15. Site kwa n'isi ihe nke ugwu nke di site na mb͕e ochie,Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ugwu ntà di mb͕e ebighi-ebi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 33