Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 10:22-36 Bible Nso (IGBOB)

22. Ọ si onye ahu nke bu onye-isi ulo anēdebe uwe, Chiputara ndi nile nēfè Beal uwe. O we chiputara ha uwe.

23. Jihu we ba, ya na Jehonadab nwa Rikab, n'ulo Beal; ọ si ndi nēfè Beal, Chọsienu ike, hu, ka otù nime ndi nēfè Jehova ghara idi n'ebe a n'etiti unu, kama ndi nēfè Beal, nání ha.

24. Ha we ba ime àjà na àjà-nsure-ọku. Ma Jihu doro nye onwe-ya ọgu ndikom anọ n'èzí, si, Nwoke ahu nke kwere ka otù onye wepuga onwe-ya nime ndikom ahu ndi mu onwem nēme ka ha ba n'aka-unu, ndu-ya gālara ndu-ya.

25. O rue, mb͕e o surebìri àjà-nsure-ọku, na Jihu siri ndi-ọb͕a-ọsọ, si kwa ndi-isi-agha, Banu, tib͕ue ha; ekwela nwoke ọ bula pua. Ha we were ọnu mma-agha tib͕ue ha; ndi-ọb͕a-ọsọ na ndi-isi-agha tupuru ha n'èzí, jerue obodo ulo Beal.

26. Ha we buputa ogidi nke ulo Beal, sure ha ọku.

27. Ha kwatu-kwa-ra ogidi Beal, kwatu kwa Beal, me ka ọ buru olùlù-ọkwu, rue ta.

28. Jihu we kpochapu Beal n'Israel.

29. Nání nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o jiri me ka Israel mehie, Jihu ewezugaghi onwe-ya n'iso ha, bú umu-ehi ọla-edo ahu nke di na Bet-el, na nke di na Dan.

30. Jehova we si Jihu, N'ihi na i mewo nke-ọma n'ime ihe ziri ezi n'anyam, i we me ulo Ehab dika ihe nile si di nke di n'obim, umu-gi ndikom nke umu-umu nke-anọ gānọkwasiri gi n'oche-eze Israel.

31. Ma Jihu elezighi anya ijeghari n'iwu Jehova, bú Chineke Israel, n'obi-ya nile: o wezugaghi onwe-ya pua na nmehie nile nke Jeroboam, nke o jiri me ka Israel mehie.

32. Na mb͕e ahu ka Jehova malitere ibipu ufọdu n'Israel: Hazael we tib͕ue ha n'ókè ala nile nke Israel;

33. site na Jọdan n'ọwuwa-anyanwu, ala nile nke Gilead, ndi Gad, na ndi Reuben, na ndi Manase, site n'Aroea, nke di n'akuku ndagwurugwu Anon, bú Gilead na Beshan.

34. Ma okwu Jihu nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya nile, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?

35. Jihu we so nna-ya-hà dina n'ọnwu: ha we lìe ya na Sameria. Jehoahaz nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

36. Ma ubọchi Jihu bu eze Israel nime Sameria di orú arọ na asatọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 10