Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 10:21-28 Bible Nso (IGBOB)

21. Jihu we ziga ozi n'Israel nile: ndi nile nēfè Beal we bia, ọ dighi kwa nwoke ọ bula fọduru nke nābiaghi. Ha we ba n'ulo Beal; ulo Beal we juputa na madu site n'otù ọnu-uzọ rue ọnu-uzọ ọzọ.

22. Ọ si onye ahu nke bu onye-isi ulo anēdebe uwe, Chiputara ndi nile nēfè Beal uwe. O we chiputara ha uwe.

23. Jihu we ba, ya na Jehonadab nwa Rikab, n'ulo Beal; ọ si ndi nēfè Beal, Chọsienu ike, hu, ka otù nime ndi nēfè Jehova ghara idi n'ebe a n'etiti unu, kama ndi nēfè Beal, nání ha.

24. Ha we ba ime àjà na àjà-nsure-ọku. Ma Jihu doro nye onwe-ya ọgu ndikom anọ n'èzí, si, Nwoke ahu nke kwere ka otù onye wepuga onwe-ya nime ndikom ahu ndi mu onwem nēme ka ha ba n'aka-unu, ndu-ya gālara ndu-ya.

25. O rue, mb͕e o surebìri àjà-nsure-ọku, na Jihu siri ndi-ọb͕a-ọsọ, si kwa ndi-isi-agha, Banu, tib͕ue ha; ekwela nwoke ọ bula pua. Ha we were ọnu mma-agha tib͕ue ha; ndi-ọb͕a-ọsọ na ndi-isi-agha tupuru ha n'èzí, jerue obodo ulo Beal.

26. Ha we buputa ogidi nke ulo Beal, sure ha ọku.

27. Ha kwatu-kwa-ra ogidi Beal, kwatu kwa Beal, me ka ọ buru olùlù-ọkwu, rue ta.

28. Jihu we kpochapu Beal n'Israel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 10