isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 31 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndi Filistia nēbuso Israel agha: ndikom Israel we b͕alaga n'iru ndi Filistia, ha we da, buru ndi eb͕uru eb͕u n'ugwu Gilboa.

2. Ndi Filistia we sosie Sọl na umu-ya ndikom ike; ndi Filistia we tib͕ue Jonatan, na Abinadab, na Malki-shua, bú umu-ndikom Sọl.

3. Agha ahu we di arọ́ megide Sọl, ndi-ọb͕a-uta we huta ya, bú ndikom chiri uta; ọ we nēb͕u ya nb͕u nke-uku site n'ib͕a-uta nke ndi-ọb͕a-uta.

4. Sọl we si onye nēbu ihe-agha-ya, Miputa mma-agha-gi, were ya mapuem aru; ka ndia anēbìghi úgwù ghara ibia mapuem aru, we kwam emò. Ma onye nēbu ihe-agha-ya ekweghi; n'ihi na ọ nātu egwu nke-uku. Sọl we were mma-agha-ya, dakwasi ya.

5. Onye nēbu ihe-agha-ya we hu na Sọl anwuwo, ya onwe-ya we dakwasi kwa na mma-agha-ya, soro ya nwua.

6. Sọl we nwua, ya na umu-ya ndikom atọ na onye nēbu ihe-agha-ya na ndikom-ya nile n'otù, n'ubọchi ahu.

7. Ndikom Israel ndi nọ n'ofè ọzọ ndagwurugwu ahu, na ndi nọ n'ofè Jọdan, we hu na ndikom Israel ab͕alagawo, hu kwa na Sọl na umu-ya ndikom anwuwo, ha we rapu obodo nile ha, b͕alaga; ndi Filistia we bia biri nime ha.

8. O rue, n'echi-ya, mb͕e ndi Filistia biara iyipu ihe ndi eb͕uru eb͕u, na ha huru Sọl na umu-ya ndikom atọ ka ha tọb͕ọrọ n'ugwu Gilboa.

9. Ha we bipu isi-ya, yipu ihe-agha-ya, ziga n'ala ndi Filistia buruburu, izisa ozi ahu n'ulo arusi nile ha, na n'etiti ndi-ha.

10. Ha we dọba ihe-agha-ya n'ulo Ashtarot: ma ha kpọgidere ozu-ya na mb͕idi Bet-shan.

11. Ndi bi na Jebesh-gilead we nu ihe bayere ya, bú ihe ndi Filistia mere Sọl,

12. ndikom nile bú dìnkpà we bilie, je ije ogologo abali ahu nile, si na mb͕idi Bet-shan buru ozu Sọl na ozu umu-ya ndikom; ha we biarue Jebesh, sure ha ọku n'ebe ahu.

13. Ha we chiri ọkpukpu-ha, lìe ha n'okpuru osisi tamarisk nime Jebesh, bue ọnu ubọchi asa.