isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 1 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e ọnwu Sọl gasiri, mb͕e Devid siri na ntib͕u Amalek lata, mb͕e Devid nọwo-kwa-ra na Ziklag ubọchi abua;

2. o rue, nubọchi nke-atọ, na, le, otù nwoke siri n'ọmuma-ulo-ikwū puta, site n'ebe Sọl nọ, uwe-ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi n'isi-ya: o rue, mb͕e ọ biakutere Devid, na ọ daruru ala, we kpọ isi ala.

3. Devid we si ya, Òle ebe i si bia? Ọ si ya, N'ọmuma-ulo-ikwū Israel ka m'wepugara onwem.

4. Devid we si ya, Gini bu ihe emere? biko, gosim. Ọ si, Na ndi Israel esiwo n'agha b͕alaga, ọzọ kwa, ọtutu nime ndi Israel adawo nwua; ọzọ kwa, Sọl na Jonatan nwa-ya nwuru anwu.

5. Devid we si nwa-okorọbia ahu nke nēgosi ya, Ì si aṅa mara na Sọl na Jonatan nwa-ya nwuru anwu?

6. Nwa-okorọbia ahu nke nēgosi ya we si, Ọ dabataram inọ n'ugwu Gilboa, ma, le, Sọl nādabere n'ube-ya; ma, le, ub͕o-ala na ndi-nwe inyinya sosiri ya ike.

7. o we gha anya n'azu, hum, we kpọm òkù. M'we si, Lem.

8. Ọ sim, Ònye ka i bu? M'we si ya, Onye Amalek ka m'bu.

9. Ọ sim, Biko, guzo n'akukum, me ka m'nwua, n'ihi na anya-ajù ejidewom: n'ihi na ndum nile dizu nimem.

10. M'we guzo n'akuku ya, me ka ọ nwua, n'ihi na amaram na ọ gaghi-adi ndu mb͕e ọ dasiri: m'were okpu-eze nke di n'isi-ya, na ọla-aka nke di n'ogwe-aka-ya, we chitara ha onye-nwem n'ebe a.

11. Devid we jide uwe-ya, dọwa ha; otú a ka ndikom nile ya na ha nọ me-kwa-ra.

12. Ha we tie aka n'obi, kwa ákwá, bue ọnu rue anyasi, n'ihi Sọl, na n'ihi Jonatan nwa-ya, na n'ihi ndi Jehova, na n'ihi ulo Israel; n'ihi na ha dara site na mma-agha.

13. Devid we si nwa-okorọbia nēgosi ya, Òle ebe i si bia? Ọ si Nwa ọbìa, bú onye Amalek, ka m'bu.

14. Devid we si ya, Ì si aṅa ghara itu egwu iseti aka-gi ibibi onye Jehova etere manu?

15. Devid we kpọ otù nime umu-okorọbia, si, Jerue nso, dakwasi ya. O we tib͕ue ya, o we nwua.

16. Devid we si ya, Ọbara-gi dikwasi n'isi-gi; n'ihi na ọnu-gi azawo megide gi, si, Mu onwem emewo ka ọ nwua, bú onye Jehova etere manu.

17. Devid we were abù-ákwá nka bùara Sọl, bù-kwa-ra Jonatan nwa-ya:

18. Ọ we si ha zi umu Juda abù uta: le, edewo ya n'akwukwọ Jasha.

19. Israel, eb͕uwo nmá-gi n'elu ebe di elu gi!Ndi-dike esiwo aṅa da!

20. Unu egosila ya nime Gat,Unu ezisala ozi-ya n'èzí nile nke Ashkelon;Ka umu-ndinyom ndi Filistia we ghara iṅuri ọṅu,Ka umu-ndinyom nke ndi anēbìghi úgwù we ghara iṅuri ọṅu-agha.

21. Unu ugwu Gilboa,Ka igirigi ma-ọbu miri-ozuzu ghara idikwasi unu, ma-ọbu ubi nke àjà-nbuli:N'ihi na ebe ahu ka asọrọ ọta ndi-dike oyi,Ọta Sọl dika agāsi na ọ bu onye anēteghi manu.

22. Ọbara ndi eb͕uru eb͕u, abuba ndi-dike,Uta Jonatan esighi na ha la azu,Mma-agha Sọl esighi kwa lata n'efu.

23. Sọl na Jonatan bu ndi nāhurita onwe-ha n'anya, buru kwa ndi di utọ na ndu-ha,Ekewaghi kwa ha n'ọnwu-ha;Ha di garagara kari ugo,Ha di ike kari ọdum.

24. Umu-ndinyom Israel, kwaranu Sọl ákwá,Onye nēyibe unu uwe uhie, ya na ihe-utọ di iche iche,Onye nātukwasi ihe-ichọ-nma ọla-edo n'uwe-unu.

25. Ndi-dike esiwo aṅa da n'etiti agha ahu!Jonatan, n'elu ebe-gi di elu ka i buru onye eb͕uru eb͕u.

26. Anọm na nkpà n'ihi gi, nwa-nnem Jonatan:I di utọ nke-uku n'ebe m'nọ:Ihu-n'anya-gi nke i hurum di ebube,Kari ihu-n'anya ndinyom.

27. Ndi-dike esiwo aṅa da!Ihe-agha esiwo aṅa la n'iyì!