isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 30 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e Devid na ndikom-ya biaruru Ziklag n'ubọchi nke-atọ, na ndi Amalek amadewo na Negeb, made kwa na Ziklag, ha etib͕uwo kwa Ziklag, sure ya n'ọku,

2. dọta kwa ndinyom na ndi nile nọ na ya n'agha, site n'onye ntà we rue onye uku: ha emeghi ka onye ọ bula nwua, kama ha dupuru ha, je ije-ha.

3. Devid na ndikom-ya we ba n'obodo, ma, le, esurewo ya n'ọku; adọtawo kwa ndinyom-ha na umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom n'agha.

4. Devid na ndi ya na ha nọ we welie olu-ha kwa ákwá, rue mb͕e ike nādighi ha n'aru ọzọ ikwa ákwá.

5. Adọta-kwa-ra ndinyom abua nke Devid n'agha, bú Ahinoam nwayi Jezreel, na Abigail nwunye Nebal onye Kamel.

6. Devid we nọ na nkpà nke-uku; n'ihi na ndi-ya siri ka ha were nkume tub͕ue ya, n'ihi na nkpuru-obi ndi-ya nile di ilu, nwoke ọ bula n'ihi umu-ya ndikom na n'ihi umu-ya ndinyom: ma Devid mere onwe-ya ka ọ di ike nime Jehova, bú Chineke-ya.

7. Devid we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, bú nwa Ahimelek, Biko, chitaram ephod nso. Abaiata we chita ephod ahu nso n'ebe Devid nọ.

8. Devid we jua Jehova ase, si, Ọ buru na achuam usu a ndi nāpunara madu ihe n'azu, #m'gēru ha aru? Ọ si ya, Chua: n'ihi na i ghaghi iru ha aru, i ghaghi kwa inaputa ha ihe nile.

9. Devid we je, ya onwe-ya na nnù ndikom na ọgu iri ndi soro ya, ọ biarue miri-iyi Besoa, ma ndi anārapu n'azu guzoro n'ebe ahu.

10. Ma Devid nāchu, ya onwe-ya na nnù ndikom: ma ọgu ndikom iri guzoro n'azu, ndi ike gwuru nke-uku na ha apughi igabiga miri-iyi Besoa:

11. ha we huta onye Ijipt n'ọhia, kuru ya jekuru Devid, nye ya achicha, o rie; ha we me ka ọ ṅua miri:

12. ha we nye ya iberibe mbadamba fig, na uyọkọ abua nke nkpuru-vine amiri ami; o we rie, mọ-ya we laghachikute ya: n'ihi na o righi nri, ọ ṅughi kwa miri, ubọchi atọ ehihie na abali.

13. Devid we si ya, Ònye nwe gi? òle ebe i si bia kwa? Ọ si, Nwa-okorọbia Ijipt ka m'bu, m'buru kwa otù nwoke, bú onye Amalek, orù; onye-nwem we rapum, n'ihi na aru adighm ike ubọchi atọ gara aga.

14. Ayi onwe-ayi madere na Negeb nke ndi Keret, made kwa n'ala nke Juda nwere, made kwa na Negeb nke Keleb; ayi we sure Ziklag n'ọku.

15. Devid we si ya, Ì gēme ka m'ridakuru usu ahu ndi nāpunara madu ihe? Ọ si, Were Chineke ṅuaram iyi, na i gaghi-eme ka m'nwua, na i gaghi-emechibidokwam nye n'aka onye-nwem, m'gēme kwa ka i ridakuru usu ahu ndi nāpunara madu ihe.

16. O we me ka ọ rida, ma, le, ha ab͕asawo n'iru ala ahu nile, nēri ihe, nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nēme kwa ememe, n'ihi ihe-nkwata uku nile nke ha kwatara n'ala ndi Filistia, na n'ala Juda.

17. Devid we tib͕ue ha site n'ururuchi we rue anyasi echi-ya: ọ dighi kwa otù nwoke nime ha wepugara onwe-ya, ma-ọbughi nnù umu-okorọbia, ndi nọkwasiri na camel-ha, we b͕alaga.

18. Devid we naputa ihe nile Amalek chiri: Devid naputa-kwa-ra ndinyom-ya abua.

19. Ọ dighi kwa ihe fọduru ha iweghachi, ma ihe ntà ma ihe uku, ma umu-ndikom ma umu-ndinyom, ma ihe-nkwata ma ihe ọ bula ha were n'onwe-ha: Devid weghachiri ihe nile.

20. Devid we chiri ìgwè ewu na aturu nile na ìgwè ehi; ha dupuru ha n'iru anu-ulo ndia, si, Nka bu ihe-nkwata Devid.

21. Devid we biakute ọgu ndikom iri ahu, ndi ike gwuru nke-uku na ha apughi ijeso Devid n'azu, ndi ha me-kwa-ra ka ha nọdu n'akuku miri-iyi Besoa: ha we puta izute Devid, na izute ndi ya na ha nọ: Devid we biarue nso ndi ahu, jua ha ajuju bayere udo-ha.

22. Ndikom ọjọ nile na ndi jọb͕uru onwe-ha, n'etiti ndi soro Devid je, we za, si, N'ihi na ha esoghi ayi je, ayi agaghi-enye kwa ha ihe ọ bula nime ihe-nkwata nke ayi naputara, ma-ọbughi inye nwoke ọ bula nwunye-ya na umu-ya, ka ha we duru ha, la.

23. Devid we si, Umu-nnem, ihe Jehova nyere ayi, bú Onye debere ayi, nye kwa n'aka-ayi usu ahu ndi nāpunara madu ihe, ndi biara imegide ayi, unu agaghi-ewere ihe ahu me otú a.

24. Ònye gēge kwa unu nti n'okwu a? n'ihi na dika òkè nke onye nārida n'agha si di, otú a ka òkè nke onye nānọdu n'akuku ihe-ayi di: ha gēkekọ n'otù.

25. O rue, site n'ubọchi ahu we ga n'iru, na o doro ya ibu ukpuru na ibu ikpé nye Israel, rue ta.

26. Devid we biarue Ziklag, zigara ndi-okenye Juda, bú ndi-eyì-ya, ufọdu nime ihe-nkwata, si, Le, ihe-ngọzi unu gēnwe sitere n'ihe-nkwata nke ndi-iro Jehova;

27. o zigara ndi nọ na Bet-el, ziga-kwa-ra ndi nọ na Remot nke Negeb, ziga-kwa-ra ndi nọ na Jatia;

28. ziga-kwa-ra ndi nọ n'Aroea, ziga-kwa-ra ndi nọ na Sifmot, ziga-kwa-ra ndi nọ n'Eshtemoa;

29. ziga-kwa-ra ndi nọ na Rakal, ziga-kwa-ra ndi nọ n'obodo nile nke ndi Jerahmeel, ziga-kwa-ra ndi nọ n'obodo nile nke ndi-Kinait;

30. ziga-kwa-ra ndi nọ na Họma, ziga-kwa-ra ndi nọ na Koa-ashan, ziga-kwa-ra ndi nọ n'Atak;

31. ziga-kwa-ra ndi nọ na Hebron, ziga kwa n'ebe nile ebe Devid onwe-ya na ndikom-ya nējeghari.